Akụkọ kachasị taa: Zuckerberg arịọla mgbaghara

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Ncheta Ikpeazụ Achuzia

Nkenke aha onyonyo Achuzia, otu n'ime ndị ndu agha Biafra nwụrụ ka ọ gbara afọ iri itoolu

E mere abalị ncheta ikpeazụ nke dike Biafra bụ kọnel Joseph 'Hannibal' Achuzia n'Enugwu ụnyaahụ.

A na-akwadokwa ime ọzọ n'Owere nakwa Asaba, taa na echi, tupu elie ya n'ụbọchị Satọde.

Cheta na Achuzia nwụrụ ụbọchị 26 nke ọnwa Febụwarị 2018, ka ọ dị afọ 90.

Mpụ dị na Legọs

Image copyright @rrslagos
Nkenke aha onyonyo Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ha ebelatala ike ndị otu badoo na-akpa n'Ikorodu

Kọmishọna ndị uweojii Lagos steeti bụ Edgal Imohimi, kwuru na site n'afọ 2014 ruo ugbua, Legọs enwetala ọtụtụ okwu gbasara ndị omekome.

O kwuru na e nwere mwakpo ndị ojiegbeezu otu puku, narị atọ na iri na ise, (1315) nke ndị otu nzuzo narị atọ na iri ise na itoolu (359), nakwa ntọ narị atọ na iri itoolu na abụọ (392) na Legọs n'ime afọ anọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Nyocha Facebook

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Mark Zuckerberg bidoro Facebook n'afọ 2004

Onye nwe Facebook bụ Mark Zuckerberg, arịọla mgbaghara maka ịhapụ ka ndị ụlọọrụ Cambridge Analytica na ụfọdị ndị ọrụ na mba Rọshịa were Facebook mee ihe masịrị ha.

O kwuru nkea ka ndị sineeti Amerịka gbara ya ajụjụ ọnụ maka ihe gbasara ihe ndekọ (data) ndị mmadụ.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Afọ 2007-08 bụ ikpeazụ Liverpool ruru agba nke anọ n'asọmpị Chamions League

Ndị otu AS Roma nyụrụ Barcelona anya ka ha ji mkpokọta ọkpụ anọ asatara otu (4-1) gbapụ ha na Champions League.

Ebe Liverpool ji mkpokọta ọkpụ ise asatara otu (5-1) gbapụ Manchester City n'otu asọmpi ahụ.

Nkeji nke ụtụtụ a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo taa

Ụmụ Naịjirịa ekwupụala uche ha gbasara nkwupụta onyeisiala Buhari na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'afọ 2019.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNtuliaka 2019: Ndị mmadụ ekwuola obi ha gbasara Buhari

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a