Etu esiri jide ndị SARS wakporo onye ojiegoachụego

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa

Mgbe maazi Immanuel James Ibe-Anyanwu tiri mkpu na soshịal midia na ndị uweojii si na ngalaba akpọrọ "Special Anti Robbery Squad" (SARS) n'asụsụ Bekee chọrọ ịnwụchị ya na gbụrụgbụrụ Okota na Legọs, ndị Naịjirịa nụrụ ya bụ mkpu zara ya.

Ibe-Anyanwu dere na paigị Facebook ya na ndị SARS chebiri ya ka ọ na apụta n'ụlọakụ wee yie ya egwu ma chọwa ụzọ ha ga-eji a na-apụ ya ego.

Ibe-Anyanwu gbabara n'ime ụlọakụ bụ ebe ọ nọ zipụ ozi mkpu enyemaka.

Okwu banyere etu SARS siri amaja ndị mmadụ bụ ihe ndi mmadụ bidoro ịkọ na soshịal midia kemgbe afọ gara aga mgbe atụmatụ akpọrọ #ENDSARS wuru na Facebook na Twitter. Mgbe ahụ, ndị uweojii Naịjirịa kwere nkwa na ha ga agbanwe SARS.

Ugbua, ọ dịzị ka ha emezughị nkwa ha kwere.

BBC Igbo gbara Ibe-Anyanwu ajụjụ maka ihe a mere, o wee gwa anyị na ezigbote ụjọ bara ya mgbe nwoke gbara afaọnụ ma yiri akwa nkiti nọchiri ya n'ụzọ wee kpụrụ ya gawa ebe ndị otu ya nọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Immanuel James Ibe-Anyanwu maka nwakpo SARS wakporo ya.

Ibe-Anyanwu gakwara n'ihu gwa BBC Igbo na ndị uweojii ọkpọrọ mgbe ihe a na-eme mechara kpọ ya sị na ha na ezite ndị uweojii ga-enyere ya aka, mana mgbe ahụ ya agbapụla.

Onụ na ekwụchitere ndị uweojii na Lagos Steeti bụ Chike Oti bụ onye kpọrọ Ibe-Anyanwu ma gwa ya bịa mara ka ndị ha nwụchịkọrọ ọ bụ ndị wakporo ya.

Mana, Ibe-Anyanwu kwuru na mgbe ya ruru Ikeja bụ ebe isi ụlọọrụ ndị uweojii na Legosi dị, ndị ya hụrụ, agbughị ndị wakporo ya.

O mechara nye ndị uweojii akara ekwentị ndị a wakporo ya jiri kpo ya mgbe ha na-eche ka o wetara ha ego ha na-ana ya n'ike.

Ọ bụ akara ekwentị a ka-eji nwụchie ndị SARS a.

Ndị uweojii na-akọwa na ha achọghị udịrị mwakpo a awakporo Immanuel James Ibe-Anyanwu, na-asịkwa na-etu ha siri nwụchie ndị kpara ike a gosiri na ha dị njikere maka ndị otu ha dara iwu.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara