Akụkọ kachasị taa: Mmadụ 257 anwụọla n' Ọlgeria
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Ọnụọgụgụ Naịjirịa na-achụ nde narị abụọ
Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ apụtala na ọnụọgụgụ Naịjirịa chọrọ iru mmadụ nde nari abụọ.
Nke a bụ ọnụọgụgụ ọhụrụ otu na-ahụ maka ọnụọgụgụ na Naịjirịa bụ National Population Commission wepụtara.
Nke a ga-eme Naịjirịa mba asaa kachasị n'ọnụọgụgụ n'ụwa niile.
Akpụpụla onye Denmark gburu nwunye ya na nwa ya na Legos ụlọikpe
Ebe foto si, AFP
Akpụpụla Peter Nielsen ụlọikpe dị na Lagos
Ọ bụ nwoke onye Denmark gburu nwunye ya Zainab na nwa ya nwaanyị ya akpọrọ Petra dị afọ atọ na Legos.
Ụgbọelu ndị agha Algerịa kpọkasịrị taa.
Ebe foto si, Reuters
Ihe ruru mmadụ 257 anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu ndịagha mere taa na mba Algeria.
Ndị ọrụ mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa n'Algeria kwuru na ndị ahụ nwụrụ nọ n'ụgbọelu na-ebu ndị agha tupu ụgbọelu ahụ akpọkasịa taa.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
N'asọmpi Uefa champịọns ụnyaahụ, ihe ịtụ n'anya mere Barcelona mgbe ndị Roma gbapụrụ ha n'asọmpi Uefa champịọns.
Ndị Barcelona jiri ọkpụ anọ asatara otu merie Roma n'ụkwụ mbụ nke asọmpi ahụ, ebe Roma n'ihe iju anya jiri ọkpụ atọ chara acha merie ma gbapụ ha.
Ajụjụ a bụrụ, ihe mere ndị Barcelona onwere ike ime ndị Real dịka ha ga-ezute ndị Juventus n'abalịa.
N'aka nke ọzọ, Bayern Munich ga-ele ndị Sevilla bụ ndị ha jiri ọkpụ abụọ asatara otu merie n'ụkwụ nke mbụ ọbịa n'ụkwụ nke abụọ taa.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Ihe onyonyo taa
Nwaanyị mụrụ ejima atọ mana ọ maghị ebe di ya nọ kamgbe ọnwa Disemba afọ 2017.
Mama ejima atọ na-ahụbeghi di ya