Akpụpụla onye ọcha uweojii sị gburu ndị be ya nga

Ndị uweojii Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Nielsen bụ onye mba Denmak bi na Naịjirịa

Ụlọikpe na Legos enyela iwu ka ejide nwoke onye Denmak bụ Peter Nielsen n'ụlọ mkpọrọ ma kpụpụ ya ụlọikpe ụbọchị.

Nielsen gburu nwunye ya Zainab bụ onye Naịjirịa na nwa ya nwaanyị Petra dị afọ atọ.

A kpọchiri ya n'ụlọ mkpọrọ dị n'Ikoyi dịka ọkaiwu ụlọikpe dị na Yaba na Legos nyere n'iwu.

Onye ọkaiwu ahụ bụ K.B Ayeye kwuru ka Nielson nọrọ n'ụlọ mkpọrọ rue oge a ga-enweta ndụmọdụ n'aka onye na-ahụ ikpụpụ ndị mmadụ ụlọikpe a na-akpọ Director of Public Prosecutions (DPP) na bekee.

A na-ekpe Nielsen ikpe maka ebubo abụọ gbasara igbu mmadụ nke o kwuru na ya emeghi ihe ọbụla.

N'aka nke ọzọ onye na-akpụpụ ya n'ụlọikpe bụ Effiong Asuquo gwara ụlọikpe na Nielsen kpara mkpamkpa ahụ ụbọchị ise ọnwa Eprel na be ya dị na Block 4, Flat 17, Bella Vista Tower, Banana Island, Ikoyi.

ọ na-ebo ebubo na Nielsen gburu nwunye ya Zainab na nwa ya Petra n'ụlọ ha.

O kwuru na mmejo a megidere iwu Legos steeti nke ntaramahụhụ ya bụ ọnwụ.

Onye ọkaikpe bugara ikpe ahụ ruo oge DPP kwuru okwu gbasara ya.

Akụkọ ga-amasị gị