Ndị ọrụ oyibo n'Enugwu emela ngagharị ịjị kelee Gọvanọ Ugwuanyi

Ndị ọrụ Enugwu
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ Enugwu na-egosipụta obi ụtọ ha

Ndị ọrụ bekee niile nọ n'Enugwu pụtara n'igwe gbagharịa ịjị gosi obi ụtọ ha nwere n'ebe ọchịchị Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nọ.

Otu ndị ọrụ dị iche iche so na ya bụ mmemme gụnyere NLC, TUC, NAWOJ, NUJ, na ndị ọzọ.

Ngagharị nkwado a malitere n' isi ụlọọrụ Enugwu bụ steeti secretariat wee gafee ogui road, site n'ọnụ asata wee bata n'ogige nzukọ bụ Okpara square dị n'Enugwu.

Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ Enugwu n'okporo ụzọ Enugwu

Onyeisi otu Trade Union Congress (TUC) bụ Igbokwe Chukwuma kwuru na obi dị ndị otu ya ụtọ n'ihi na Gọvanọ Ugwuanyi anaghị eji ndị ọrụ ụgwọ.

O kwuru na ọ na ebuli ha n'okwa ma na-enye ha orụ ruru ha nile.

Onye ndu ''Nigeria labour Congress'' (NLC) n'Enugwu bụ Nwobodo Viginous kwuru na Gọvanọ Steeti ndị ọzọ kwesiri iṅomi mkpụrụ ọma Gọvanọ Ugwuanyi kụrụ.

Dịka o si akwụ ndị ọrụ ụgwọ kwa mgbe ma na-enyekwa ndị lara ezumike nka ụgwọ ruru ha nile.

Ndị ọrụ bekee abuọ kwuru na ha so na-eme ngagharị nkwado ahụ n'ihi na obị dị ha ụtọ na anaghịzị eji ha ụgwọ.

Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ Enugwu n'ọdụ n'Ọkpara Square dị n'Enugwu

Ha kwuru na Gọvanọ Ugwuanyi kwụrụ ha ụgwọ ọnwa mmanyere bụ ''13th month'' n'olu bekee okwere ha na nkwa.

Ndị ọrụ bekee ahụ karịrị mmadụ puku narị ise gwara Govano Ugwuanyị ka ọchịchị ya jide nke o ji.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara