Abaribe kwuru na 'Buhari adịghị ike ọrụ'

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Okwu Sịnetọ Abaribe gwara Onyeisiala Buhari

Ndị Ụlọomeiwu ukwu nwere ọgbaghara n'etiti ha taa mgbe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe nke Abia Steeti kwuru na onyeisiala Mohammadu Buhari adịghị ike ọrụ.

Abaribe rụtụrụ aka n'okwu onyeisiala kwuru na Lọndọn na ọ bụ ndị si mba Libịa butere ogbugbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụugbo.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa

INEC ekwupụtala ngwa ha ji eme ntuliaka 2019

Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ụlọọrụ ahụ agaghị eji ngwa electronic eme ntuliaka afọ 2019, kama ha ga-eji technụzụ maka ịgụkọ na ngọsịpụta ntuliaka ahụ.

Yakubu kwuru nke a na mmechi ọgbakọ emere maka iji technụzụ eme ntuliaka na Mba Afrịka niile.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị otu PDP na ndị patị ndị ọzọ nọ n' ụlọ nta omeiwu na-esi ọwụ ka emegharia usoro ntuliaka ọchịchị na Naịjirịa

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Okwu Emmanuel Macron gbasara mwakpo Sirịa

Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwuola na onwere ihe ngosi na gọọmenti mba Sirịa jiri ngwagha kemịkal wakpoo obodo Douma.

Macron kwuru na ọ ga-ekpebi mgbe ọ ga-eji ngwaagha ụgbọelu wakpọ Sirịa na nzaghachị.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Emmanuel Macron kwuru na iji ngwaagha kemịkal awakpo bụ ị gafe oke

N'egwuregwu

CSKA Moscow ga-ele Arsenal ọbịa n'ukwu abụọ nke asọmpi Uefa Europa n'abalịa.

Cheta n'ụkwụ nke mbụ, Arsenal jiri ọkpụ anọ asatara otu merie ndị CSKA Moscow n'asọmpi ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ahmed Musa na Alex Iwuobi

Nkeji nke mgbede a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe onyonyo taa

Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ọrụ gị kwesiri ịbụ nke kachasị mma na foto'