Mgbacha Champions League: Usoro eji ga-agba asọmpị

Otu Liverpool Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Liverpool jiri ọpkụ ise mmerị Man City

Usoro a ga-esi agba okara-ịkpeazụ asọmpị Champions League apụtaala.

Liverpool na Roma ga-asọ mpị n'ụbọchị 24 n'ime ọnwa Epureeli, ha ga-agba ụkwụ nke abụọ n'ụbọchị abụọ n'ime ọnwa Mee.

Bayern Munich na Real Madrid ga-atụ aka n'ụbọchị 24 n'ime onwa Epureeli na ụbọchị otu n'ime onwe Mee.

Ha ga-agba ngwụcha asọmpị a n'obodo Kiev n'ala Ukraine n'ụbọchị 26 n'ime ọnwa Mee.

Liverpool bụ ndị mmeri Champions League n'afọ 2005.

Ha na ndị Roma agbabeela bọọlụ ọbụla kamgbe ọnwa Maachị afọ 2002.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ronaldo bu onye nyere goolu gbafuru Juventus na-asọmpị a

Bayern Munich ekwuola na Niko Kovac ga-abụ onye ga-anọchị Jupp Heynckes dịka onye nkuzi ha n'asọmpị a.

Nke a ga-abụ ugboro abụọ Heynckes kuziri Bayern ka mgbe mmeri ha n'afọ 2013.

Mana asọmpị ha na ndị Real Madrid ga-ekpo ọkụ makana Real bu ndị buru iko a n'afo garaaga.

Real Madrid emeriela iko a ugboro atọ n'ime afọ anọ garaaga.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara