Kedụ ihe a ga-eji ego Abacha zuru mee na Naịjirịa?

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Ihe onyonyo taa

Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ọrụ gị kwesiri ịbụ nke kachasị mma na foto'

Ncheta ikpeazụ Achuzia

Nkenke aha onyonyo Achuzia nwetara echichi Ikemba nke Ahaba nakwa Ọchịagha ndị Anịọma oge ọ dị ndụ

Nnia Nwodo bụ onye isi Ohaneze ndị Igbo gwara ụmụ dike Biafra bụ Joe Achuzia ka ha gbaa mbọ hụ na ha soro nzọụkwụ nna ha.

O kwuru nke a ka e mere emume ncheta ikpeazụ Achuzia n'Asaba ụnyaahụ.

A ga-eli Achuzia echi n'Asaba.

Ego Abacha zuru

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Abacha bụ onye agha, chịrị Naịjirịa afọ ise dịka onyeisiala tupu ọ nwụọ n'afọ 1998

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwenyela na onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Sanị Abacha, zuru ọtụtụ ego.

O were Buhari afọ iri ikwenye ma kwupute site n'ọnụ ndị mịnịstrị na-ahụ maka akụnaụba, na nde dọla narị atọ na iri abụọ na abụọ ($322.5) ndị mba switzerland nyeghachịrị Naịjirịa so n'ego Abacha zuru.

Cheta n'afọ 2003, gọọmentị kwukwara na a hụrụ ego Abacha zuru, nke ruru nde dọla iri abụọ na abụọ ($22m).

Akụkọ ndị ga-amasị gị

N'akụkọ mba ofesi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mba Rọshịa bụ enyi mba Sirịa ma na-ejikwa ndị agha ha na-akwado gọọmentị ha

Ndị mba Rọshịa adọọla mba Amerịka aka na ntị maka ibido agha n'etiti mba ha abụọ.

Ha kwuru na ọ bụrụ na Amerịka si n'elu tụọ ha ogbuniigwe, ma wakpoo ha maka ebubo eboro ha maka iji ngwaagha kemịkal gbuo ọtụtụ mmadụ na Siria, na agha nwere ike ibido n'etiti ha.

N'egwuregwu

Image copyright Rex Features
Nkenke aha onyonyo Arsenal bụ otu nke ise si mpaghara England ga-eru ọkara-ịkpeazụ nke Europa League kamgbe eji bido asọmpi a ruo ugbua

Naịjirịa nwetara otu Ihe nrite n'egwuregwu commonwealth ụnyaahụ, nke mere ka nchịkọta ihe nrite ha bụrụ iri na abụọ ugbua.

Ebe otu Arsenal ji mkpokọta ọkpụ isii asatara atọ gbapụ ndị CSKA Moscow n'asọmpi Europa League.

Nkeji nke ụtụtụ a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a