Akụkọ kachasị n'ụtụtụ: 'Ndigbo saanụ anya mmịrị na 2019'

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Ndị "NGO" akpọọla ndị Igbo ka jikere maka 2019

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị NGO arịọla ndị Igbo ka ha ga gbata akwụkwọ ntuliaka

Ndị otu nọọrọ onwe ha a kpọrọ NGO na bekee arịọla Ndịgbo ka ha doo anya n'ala chọwa ihe dabara mmiri na ntuliaka nke 2019.

Jude Ohanele bụ otu n'ime ha kwuru nke a na ọgbakọ Situation Room nwere n'ụbọchị Tuusde rịọrọ ka onye Igbo ọbụla ruru ogo kawa ahụ gbata akwụkwọ ntuliaka.

Sinetị Naịjirịa sị sị chụọ ndị

Image copyright Nigerian Senate/twitter
Nkenke aha onyonyo Sineti Naịjirịa e nweghịzị okwukwe n'ebe ndị isi ọrọ nchekwa nọ

Ụlọomeiwụ ukwu bụ Sịnet akpọọla Onyeisiala Buhari oku ka ọ chụọ ndị isi ọrụ nchekwa Naijiria niile n'ọrụ.

Ha kpọrọ oku a maka oke ogbugbu mmadụ ka na-aga n'ihu n' obodo dị icheiche na Naịjirịa..

Barbara Bush alakwurula ndị nna ya ochie

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Barbara Bush bụ nwaanyị a ma ama n'ihi okwukwe ya

Barbara Bush, nwunye onye bụbu onyeisiala Amerịka nakwa onye na-alụ ọgụ ikwado agụmagụ anwụọla n'afọ iri itoolu na abụọ (92).

Bush bụ nwaanyị si n'ezinaụlọ ndọrọndọrọ ọchịchị na-adị mma nke wepụtara onyeisiala Amerịka abụọ - di ya bụ George H. Bush na nwa ya nwoke bụkwa George .W. Bush.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa:

N'egwuruegwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Man. U bụ ndị nke abuo ebe Bournemouth bụ ndị nke iri na otu na okpokoro ligi

Ndị Bournmouth na Manchester United ga-akwarịta mpi taa n'elekere isii nke mgbede.

Man U emeribuola Bournemouth ugboro abuo n'ime isii ha sọburu mpi. Ebe ka ha nọ n'okpokoro ligi?

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa:

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ise ị kwesiri ịme tupụ ị bu ezigbo otiegwu - Phyno

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a