Taa bụ afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Taa bụ ncheta afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok

N'ụbọchi taa, Naịjirịa na otu dị iche iche na mba ụwa niile dịka UNICEF, BBOG na-echeta afọ anọ atọrọ ụmụ akwụkwọ Chibok dị narị abụọ na iri asaa na isii.

Cheta n'abalị iri na anọ nke ọnwa Epurelu n'afọ 2014 ka ndị Boko Haram tọọrọ ụmụaka ndị a n'ụlọ akwụkwọ ha dị na Chibok nke Borno Steeti.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Atọọrọ ụmụakwụkwọ Chịbok n'abalị iri na anọ nke ọnwa Epurelu n'afọ 2014

Ndị Afara Ukwu Ibeku, Abia Steeti Ahụbeghị onye Eze ha

Praịm mịnịsta ọdịnala nke Ụmụobasi,Isiama Afara Ukwu bụ Chiemelam Odoemelam etiela na mkpu na ndị obodo ha ahụbeghị onye Eze ha bụ Isreal Okwu Kanu nna onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Ọ rịọrọ ka ndị ji ya na ezinaụlọ ya kpọpụta onye Eze ha ma ọ dị ndụ ma ọ ọnwụrụ anwụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Naịjirịa wakporo ezinaụlọ Obieze Eze Isreal Okwu Kanu bu nna Ipob bụ Nnamdi Kanu

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Mba Amerịka, Uk na Fransị atụọla ogbunigwe na mba Sirịa

Mba Amerịka , United Kingdom na Fransị agbakọtala aka ọnụ tụọ ogbunigwe n'ụlọọrụ ebe a na-eme ngwaagha kemịkal na mba Sirịa, maka mwakpo ha jiri ngwaagha ahụ mee n'obodo Douma.

Ogbunigwe a gbara n'isi obodo Sirịa bụ Damascus, nakwa obodo abụọ ọzọ dị na mpaghara Homs.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ogbunigwe mịzaị mba Fransị dịka ọ na-efepụ

N'egwuregwu

N'abalị ụnyaahụ, ụmụ afọ Naịjirịa zakọọrọ nrite ọlaedo anọ nke mere ya ọlaedo asatọ ha nwetarala n'egwuregwu commonwealth.

Naịjirịa bụ ndị abụọ kachasị enweta ihe nrite na Afrịka ma agụpụ mba Saụt Afrịka.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụ Naịjirịa na-anọchite Naịjirịa n'egwuregwu ahụ

Nkeji nke mgbede a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo taa

Ihe onyonyo a gosiri ahụhụ ndị ụmụaka bụ ụmụ ndị China na-ata na Ghana.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤmụnwaanyị Ghana tụrụ ime n'aka ndị China na ụmụ ha n'ata ahụhụ