E liri dike Biafra bụ Joe Achuzia n'abalị
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Akwa m ozu Joe Hannibal Ajuzie
Joe Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970
A ga-edowe ahu dike Igbo jiri jee mba bụ Joe Oseloka Hannibal Achuzia na ala echi.
N'elekere iri na abuo (12:00 am) nke isi ututu ka a ga-eli ya na obi ya dị na Idum ojeyi, umuezeyi n'Asaba.
Ụmụakwụkwọ Chibok 15 n'ime 112 eji eji bụ ihe ka dị ndụ
Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapụrụ n'agbụ na-agụzị akwụkwọ na mahadum dị n'Amerịka
Ozị na-eru BBC ntị ekwuola na ọ bụ nanị mmadụ iri na ise (15) fọrọ ndụ na mmadụ otu narị na iri na abuo (112) ụmụakwụkwọ Chibok a ka ji eji.
Ahmed Salkida bụ onye so na ndị gara okwu maka ịtohapụ mmụaka ahụ kwuru nke a.
Mana ọnụ na-ekwuru gọọmenti Naịjirịa sịrị na ha ka nwere olile anya na ụmụagbọghọ niile ndị ahụ ga apụtacha.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Onyeisiala mba Rọshịa akọọla ogbunigwe agbara na mba Sirịa
Ebe foto si, AFP
Ogbunigwe mịzaị mba Fransị dịka ọ na-efepụ
Onyeisiala mba Russia Vladimir Putin ji obi iwe katọọ ogbunigwe a ndị US, UK na France turu na Syria n'isi ụtụtụ a.
Ndị mba ahụ ji ogwunigwe ndị ahụ atụrụ wee dọọ Syria aka na ntị maka ngwagha kemịkal ha ji gbuo ndi be ha n'izu gara aga.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
E merie Manchester City n'ime Asọmpi atọ ha gbarala na esepụghị aka
Nkeji nke mgbede a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkịrị nke taa
Ihe onyonyo a gosiri ahụhụ ndị ụmụaka bụ ụmụ ndị China na-ata na Ghana.
Ụmụnwaanyị Ghana tụrụ ime n'aka ndị China na ụmụ ha n'ata ahụhụ