N'Enugwu mgbọ atụgbuola nwaanyị n'akwamozu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uwe ọji na-echocha ihe mberede ahụ

Dịka a na-eme mmemme akwamozu n'obodo Amanato Mburumbu dị na okpuru ọchịchị Nkanu-East nke Enugu Steeti , ozu ọzọ dọrọ na mberede oge mgbọ tụrụ otu nwanyị bịara ụlọakwa.

Dịka akụkọ siri kwuo, ọha obodo gbakọrọ ili onye nwụrụ anwụ, otu nwoke a kpọrọ Daniel Chukwu ji egbe nta bịa n'ebe ahụ ma dịka ọ naa anyapụta egbe ahụ n'ubu ya, ma dịka ọ na anyapụta egbe ahụ, mgbọ pụrụ na ya ga-tụọ otu nwanyị dị ihe dịka afọ iri anọ, ma gbuo ya, ebe onye ọzọ merụrụ ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugu Steeti bụ Ebere Amaraizu kwuru na yabụ akụkọ bụ eziokwu ma kọwa na nwa amadị ahụ na-eneyere ndị uweojii aka inyocha ihe mberede ahụ mere.

Image copyright Ebere Amaraizu
Nkenke aha onyonyo Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu kówara na ndị uweojii na-enyocha ihe mberede ahụ mere

O kwuru na nwoke ahụ jiri egbe ya nke ike kwa, ọ maghị na ọ dị njikere ọgbụgba ga ebe a na-akwa ozu, ma oge ọ chọrọ inyapụ ya, mgbọ pụrụ na ya ga tụọgbo otu nwaanyị ma merụkwa onye na-akwa ozụ aha ya bụ Hawaya Nworiuzo ahụ.

O kwukwara na ndị mmadụ gbara ọsọ ngwangwa ha nụrụ ụda egbe n'ihi na ha chere na ọ bụ ndị ọchịehi wakporo ha.

Ọ gara n'ihu sị: " Ndị uweojii ebidola nyocha iji mata ihe mere, ebe onye a eboro ebubo na enyere ha aka na nyocha ahụ.

A natara ya egbe ahụ, ebe adọnyere ozu nwaanyị ahụ n'ụlọozu."

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a