Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapụrụ n'agbụ na-agụzị akwụkwọ na mahadum dị n'Amerịka

Gọọmenti etiti agọnarịla akụkọ Ahmed Salkida wepụtara nke kwuru na ọ bụ naanị mmadụ iri na ise n'ime ụmụakwụkwọ Chibok otu narị na iri na abụọ eji eji ka dị ndụ

Onye ndụmaọdụ onyeisiala na mgbasa ozi bụ Malam Garba Shehu kwupụtara nke sị na aka Ahmed Salkida adịghị na mkparịta ụka ịtohapụ ụmụaka ndịa.

Nwaanyị zutere ọnwya n'akwamozu ọ gara n'Enugwu Steeti

Image copyright Ebere Amaraizu
Nkenke aha onyonyo Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu kówara na ndị uweojii na-enyocha ihe mberede ahụ mere

Ihe mgbawa obi emela mgbe onye bịara ịkwa ozu soro ozu laa mụọ. Otu nwanyị akpọrọ Ngozi Eze zutere ọnwụya dịka otu nwoke otu nwoke bụ Daniel Chukwu jiri egbe gbagbuo ya n'amaghị ama.

Nke a mere na Amanato mburumbu dị na Nkanu west nke Enugwu Steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Donald Trump adọọla Gọọmentị mba Sirịa aka na ntị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla ndị gọọmenti Sirịa aka na ntị na ha ndị na njikere ịtụ ogbunigwe ọzọ ma ọ bụrụ na o sepụghi aka n'iji ngwaagha kemịkal awakpo ndị mmadụ.

Ebe gọọmenti mba Sirịa ekwuola na aka ha adịghị na ngwaagha Kemịkal na ọ bụ ndị agha nnupiisi boro ha ebubo ime mwakpo ahụ.

N'egwuregwu

Nkenke aha onyonyo Hawkins gara inweta ọlaedo ma ọbụrụ na ọ gbara ọsọ rue n'isi

Ohere irite ọlaedo n'ịgba ọsọ ikeagwụnwamkpị n'egwuregwu Commonwealth akwala otu nwoke bụ Callum Hawkins nwafọ Scotland.

Hawkins dara n'ala ugboro abụọ dịka ọ fọdụrụ nkeji abụọ ka o merie n'ọsọ ahụ nke mere onye ọzọ jiri rite ọlaedo ahụ.

Nkeji nke mgbede a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa

N'ihe nkiri a, Sịnetọ Enyinnaya nke Abia Steeti kwuru na ndị ọchị ehi chọrọ ị napụ ụmụ afọ Naịjirịa ala ha n'ike

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi.