Na Senegal a na-enwe ọgbakọ banyere ịba

Onye anwụnta na-ata Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anwụnta na-ebute ọrịa ịba

Dịka onye ntaakụkọ BBC na Dakar bụ Alex Duval Smith si kọwa, , ndị nchọpụta na ndị ọkachamara n'ihe gbasara ọrịa ịba (malarịa) dị pụkụ atọ abatawala mba Senegal maka ọgbakọ ịkpa etu a ga-eji kpochapụ ịba.

Nke a bụ afọ iri abụọ kemgbe ejirri nwe ọgbakọ ụzọ dị icheiche agaesi merie ịba nke a kpọrọ 'Multilateral Initiative on Malaria,' na bekee na-emekwara na mba Senegal.

O ge ahụ, olileanya na a ga-ekpochapụ ịba nke a na-ebute site na anwụnta ka dị anya.

Ma ugbua, ngalaba ahụike mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ kwenyere na kpochapụ ịba na mba Afrịka isii; Algeria, Comoros, Madagascar, Gambia, Zimbabwe na Senegal.

Senegal agbalịela n'ọgụ ha na-alụ site na i belata 40% ọnwụ site n'ọrịa ịba na 10 pasenti.

Ọganihu e nwere na-egosi nsogbu ọhụrụ. Ịba na-agbaike na mba iri itoolu n'ụwa mana ọnwụ site n'ịba kachasxsị na naani ịrị na asatọ n'ime ha.

ọnwụ site n'ọrịa ịba gbaliri elu na Najiria, Aịvrị Kostụ, Saụt Sudan na Centralụ Afrika Repọblik.

Dịka WHO siri kwuo, ịba na-egbu ihe karịrị mmadụ 400,000 kwa afọ, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara