Buhari na Trump ga-enwe mkparita ụka n'ụbọchị iri atọ nke Epreelụ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:

Buhari na Trump ga-enwe nzụkọ

Image copyright AFP

White House edepụtala akwụkwọ na-ekwu na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ga-ezute ogbo ya nke Naịjiria bụ Muhammadu Buhari n'ụbọchị iri atọ nke epreelu.

Ọganiru, nchekwa, ịlụso ndị na-eyi ndụ egwu agha n'ezi ọchịchị so n'ihe ndị ha ga-akpa na nzụkọ ahụ.

Sọsọ onyeohi ga-achịnwu Naịjiria - Musa

Gọvanọ chịburu Kaduna steeti bu Balarabe Musa ekwuola n'onweghi onye ọbụla ga-abanye ọkwa onyeisiala Naịjiría na abụghị onyeohi maọbụ nwe nkwado ndịohi.

Ọ sị na ọ hiara ahụ ịchọta ego eji akwado ịzọ ọchịchị na-amaghị ụfọdụ ndị na-ezu ohi ga-akwado gi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ghana na-akwado ịkwụ ụgwọ ha ji Naịjiria

Image copyright Getty Images

Gọọmentị mba Gbana ekwuola na ha na-ahazi atụmatụ ibido ịkwụghachi ego rụrụ nde otu narị dọla bụ ụgwọ ha ji Naịjiria maka mmanụ agbidi e nyere ha n'afọ ndị gara aga.

Ego ha ji Naijiria ruru nde narị dọla na iri isii n'ọnụọgụgụ.

N'egwuregwu

Image copyright Rangers FC

Rangers awụọla onwe ha n'ala dịka ha enyeghị ọkpụ goolụ ọbụla n'asọmpị NPFL na Kwara United nwere ụbọchị ụka. Ha nọ n'ọkwa asaa ugbua na NPFL.

Nkeji ụtụtụ a:

Gere akụkọ nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ BBC Igbo

Ihe nkịrị nke taa

Ihe onyonyo a gosiri ụmụ Igbo na-agba mbọ na Ladipo, Legos.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGear technican advises Igbo to pay attention to handwork.