Ndị uweojii: Atọọrọla onye mba Jamini na Kano

Ndị uweojii Image copyright BBC Sport
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na-ahụ maka nchekwa obodo

Ozị ndị uweojii Kano Steeti wepụtara na-ekwu na ndị na amaghị nsị ha bụ bu egbe gburu onye uweojii na-echekwa otu nwafọ mba Jamini tupu ha tọọrọ nwoke ahụ.

Ihe a mere n'ụbọchị taa bụ iri na isii n'ọnwa Epurelu mgbe ọfọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ nke ụtụtụ a n'okporo ụzọ Sabon Titi Madobi dị na Kano.

Ha kwuru na mmadụ ise bu egbe nọrọ n'ụgbọala gbachiri ugbọala bu ndị ọrụ Dantata and Sawoe Construction Company ihu malite na-agba ha egbe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ndị mwakpo a gburu otu onye uweojii ngalaba Special Protection Unit (SPU) na-echekwa nwafọ mba Jamini akpọrọ Michael Cremza na-arụ n'ụlọọrụ ahụ.

Kọmishịọna ndị uweojii na Kaneọ Steeti bụ Rabiu Yusuf ezipụla ndị uweojii na gburugburu ebe ahụ, iji nwụchie ndị ahụ ma kpọpụta nwoke ahụ.

Ha kwuru na ha na-aga n'ihu ịchọsi ndị a ike ma kwuo na onye ọ bụla nwere kepukepu gbasara ebe ha nọ, kọwara ndị uweojii.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a