Na Naijiria ndị ọrụ ahụike ga-agba abụbụọrụ

Prof. Isaac Adewole Image copyright @IsaacFAdewole
Nkenke aha onyonyo Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Isaac Adewole hibere kọmiti maka nchọpụta ọnọdụ ọnụọgụgụ na ahụike ndị najiria akpọrọ 2018 Nigeria Demographic Health Survey (NDHS) na bekee nsonso a

Ndị ọrụ ahụike na Naijiria gburugburu malitere abụbọọrụ n'abalị Tuusde n'ihi ebubo na gọọmentị etiti ekweghị emezu nkwekọrịta ha nwere.

Dịka onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ ahụike bụ Joint Health Sector Union (JOHESU) n'aha bekee bụ Josiah Biobelemoye, siri kwuo n'akwụkwọ otu ahụ depụtara, ihe butere abụbọọrụ ahụ bụ omume 'ọgbasaghị m' nke gọọmenti na ndị ndu ngalaba ahụike.

N'ụbọchị Monde, ha kwuru na ha ga-ebido abụbụọrụ n'abalị Tuusde ma ọ bụrụ na gọọmennt hapụ ime ihe ha chọrọ.

Ihe ndị ọrụ ahụike chọrọ ka gọọmentị mere ha dịka Biobelemoye siri kọwaa gụnyere ibuli ụgwọọnwa ndị ọrụahụike, iwe ndị ọhụrụ n'ọrụ nakwa imezu mkpebi ụlọikpe nwere n'okwu ha na gọọmenti etiti nwere n'ibuli afọ onye ọrụahụike na-arụ ọrụ site n'afọ iri isii gaa afọ iri isii na ise.

O kwuru na ndị ọrụ ahụike kwụsịrị abụbụọrụ ha gbara n'ọnwa Septemba 30, afọ 2017 ka ha na gọọmenti tinyechara aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke a kpọrọ, Memorandum of Terms of Settlement (MOTS) na bekee.

Dịka o siri kwuo, e kwesịrị imezu ihe nile ekwekọrịtara n'akwụkwọ nkwekọrịta a n'ime izuụka ise ha jiri kwụsị abụbụọrụ ahụ ha gbara na mbụ.

O kwuru na ọnwa isii agala kemgbe ha jiri kwusị abụbụọrụ mana gọọmenti emebeghị ihe doro anya banyere ihe niile bụ okwu.

Biobelemoye kwuru na n'abalị ise nke ọnwa Febrụwarị, otu ha nyere gọọmenti abalị iri abụọ na otu iji mezuo nkwekọrịta ha nwere.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha tụkwasara abalị iri atọ ka abalị iri abụọ na otu ha nyere ha gara.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a