Ndị uweojii nwụchiri ndị Shiite 115

Ngagharị iwe ndị Shiite
Nkenke aha onyonyo Ngagharị iwe ndị Shiite na-achọ ka ndị gọọmentị etiti kpọpụta onyeisi ha nọrọla afọ abụọ n'ụlọ mkpọrọ

Ndi uweojii kwuru na ha nwụchiri ndị so n'otu Shiite ruru otu narị na iri na ise (115) bụ ndị mere ngagharị iwe n'Abuja.

Ha kwuru nke a n'akwụkwọ ndepụta ha wepụtara iji kọwaa ihe mere n'etiti ha na ndị Shiite oge ha mere ngagharị iwe maka onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky, gọọmentị etiti ji eji kamgbe afọ.

Ndị uweojii kwuru na ndị ha nwụchiri so na "ndị wakporo ndị mmadụ nkịtị, kwụsị ọrụ ndị mmadụ, kwụsị ngagharị ụgbọala ma kụwakwaa ugegbe ụgbọala ndị mmadụ".

Ha kwukwara na "enweghị onye nwụrụ na ngaghịrị iwe a dịka ndị

Anjuguri Manzah bụ onye na ahụ maka mmekọrịta ndị uweojii na ndị nkịtị n'Abuja, kwuru na ha napụtara ọtụtụ ihe mmerụ ahụ dịka katapọt, okwute na igwe n'aka ndị otu ahụ akpọrọ El-Zakzaky Islamic Movement in Nigeria (IMN).

Manzah kwukwara na ndị otu ahụ merụrụ ndị uweojii 22 ahụ ma mebikwaa ụfọdụ ụgbọala ha.

Ihe ga-eme

Ndị uweojii kwuru na ha ga-enyocha ihe merenụ ma kpọpụ ndị a ha na-enyo enyo ụlọakwụkwọ ma ọ bụrụ na enyopute ha ihe n'aka.

Ha dọkwara ndị otu Shiite ndị ọzọ aka na ntị ka ha kwụsị imebi udo ndị mmadụ n'Abuja.

Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii kwuru na onweghị onye nwụrụ na ngagharị iwe a

Otu onyeisi ndị otu Shiite gwara BBC na ndị uweojii gbara ọtụtụ n'ime ha egbe, ma kwuo na ha abaghị ndị uweojii ọgụ kama na ọ bụ ndị uweojii manyere ha.

O kwukwara na ndị uweojii nwụchịrị otu nwoke so na ndị isi ha n'akụkụ Unity Fountain ka a na-eme ngagharị iwe a.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a