A nwụchiela sinetọ duru ndị agbero bata n'ụlọ omeiwu taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị omeiwu zọrọ isi ha ka ndị ike bịara buru osisi ọfọ ndị sineti

Akụkọ na-ekwu na Sinetọ Ovie-Agege bụ sinetọ na-anọchite ndị Delta Sentraal bụ onye duru ndị omekome ahụ we wakpoo ụlọomeiwu sinetị taa we buru ọfọ ha.

Kọmịtị na-ahụ maka ịdọ ndị sinetọ aka na ntị kwụsịrị sinetọ Ovie ọrụ maka ihe o kwuru gbasara akwụkwọ iwu na-eguzobe ntuliaka.

A kwụsịrị ya ọrụ rue ụbọchị ọrụ iri itoolu, ndị mmadụ na-ekwu na nkwụsị n'ọrụ ahụ kpatara o ji wakpoo sineti taa.

Ndị ntaakụkọ Nation wepụtara ihe onyonyo gosiri etu e si nwuchie ya n'akara twitter ha.

Ha kwuru na ndi uweojii anwụchiela sinetọ Ovie mana onweghi ọfọ a hụụ o ji.

Ndị ụlọ omeiwu nta sonyere nọnyere nke ukwuu taa oge o ji nkeji iri atọ na ise gafee elekere iri na otu inọnyere ha maka ọgbataugheie ahụ mere n'ụlọ ahụ taa.

Ọgbakọ ụlọ omeiwu abụọ kpebiri ka onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim idris na onyeisi ndị ngalaba nchekwa obodo a na-akpọ Department of State Services na bekee bụ Lawal Daura ka ha chọta ọfọ ahụ tupu otu ụbọchị agafee.

Ihe Sineti kwuru

Tata bụ Wenezde ka Sinetọ Ovie ọmo-Agege kpọrọ ndị omekaome bu egbe were bata na ụlọomeiwu ukwu bịa maburu osisi ọfọ ndị Seniti.

Ndị otu sị na omume a bụ arụ megide obodo Naịjirịa nke nwere ike ịgbachapụ obodo a ọkpa n'ala maka na ihe ha mere megidere otu na-ime ngalaba atọ ji obodo a.

Ha sịkwa na-aga ejị iwu megidere ụdị akwaa lebe ya anya.

Ha kpọrọ oku ka ndị otu nchekwa niile kee nkwucha ma dịkwa njikere ịnapụta ya bụ osisi ọfọ ma nye ndị gbara agwa ahụ ntaramahuhu dịrị ha.

Ha gbaruru ihu kwuo na omume a bụ nkaram anya megide ndị omeiwu.

Agbanyeghị, ndị otu a ewerela osisi ọfọ ọzọ were malite orụ n'ụlọomeiwu ahu taa.

Akụkọ ga-amasị gị: