Massob: Mwepụ ọfọ n'sineti agbarala anyị aka ebe

Ndị otu Biafra Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ọnụ na-eru n'okwu na-enye iwu ka ewepụ Biafra n'akwụkwọ oyiegwu.

Otu Massob nọ n'okpuru ọchịchị Uchenna Madụ egosila obi ụtọ ha gbasara ihe mere na sineti ala Naijiria taa gbasara.

Iji mwakpo wepụ osisi ọfọ nke na-egosi mkpebi n'ụlọ omeiwu agbalara ha akaebe.

Massob kwuru na dika otu ndị ọchụ udo ha bụ na ha ekwenyeghị na mwakpo maọbụ agwa ọjọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Massob so na otu na-achọ nkewapụta Biafra

Ha kwukwara na ya bụ mwakpo gosiri na ihe ọchịchọ Biafra bụ ihe dị n'iwu nke ndị nchekwa Naịjirịa agaghị akwụsịnwụ.

N'ọnụ ha, ''mwakpo a gosiri na obodo Naijiria adaala n'ụdị na agaghị emekwatanwụzi ya ọzọ.''

Ha juru ke ka ndị agboro gha-esi wakpo nnukwu ụlọomeiwu ahụ na-enweghị ndị ọrụ nchekwa kwụsịrị ha.

Massob kwuru na ụjọ na-atụ ha maka ndị Naịjirịa ndị ọzọ.

Ha kwuru na ihe a gosiri na onweghị nchekwa siri ike na Naịjirịa.

Ihe ndị ọzọ Maasob kwuru maka mwakpo

  • ''Anyị kwunyere T.Y Danjuma kwuru ka ndị middle belt nakwa ndị ọdịda anyanwụ zọwa onwe ha n'aka ndị ọchị ehị
  • Sinetọ na-ekwuchitere mpaghara dị iche iche na Naijiria laghachị na be ha maka na iwu obodo akawadoghị ha.
  • Obodo adịghịzị mma obibi

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: