Kaduna steeti achụọla ndịnkuzi 4,562 ọzọ n'ọrụ

Nasir El-rufai Image copyright @KadunaAtwork
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ na-achị Kaduna steeti chụburu ndị nkuzi 22,000 maka amaghị ede

Gọọmentị Kadụna steeti chụrụ ndịnkuzi 4,562 n'ime 15,897 ha were n'ọrụ na steeti ahụ na nsonso a n'ihi na ha amaghị ede akwụkwọ ozi.

Dịka onye enyemaka pụrụiche nke Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Alhaji Lawal Danjuma kwuru, ndị a achụrụ bụ ndị adigboroja amaghị onye tinyere aha ha n'akwụkwọ.

"Onye nkuzi ọbụla edenwughị akwụkwọ ozi ji kwuo na ya nabatara ọrụ enyere ya abụghị onyenkuzi. Anyị agaghị akpọrọ ụmụaka anyị nye ha ka ha kuziere ha."

Danjuma kwara BBC na gọọmenti ga-ewe ndị nkuzi 13,665 n'oge na-adịghị anya.

N'afọ gara aga, Kaduna steeti chụrụ ndịnkuzi praịmarị dị 22,000 n'ọrụ maka ịda obere ule enyere ha.

Akụkọ ga-amasị gị: