Ndị uweojii kwuru na ha na-achọtala ọfọ sineeti

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:

Achụpụla osote onyeisi omeiwu Delta

Image copyright Delta state House of Assembly
Nkenke aha onyonyo Friday Osanebi

Ụlọikpe ukwu dị na Kwale, achụpụla Friday Osanebi bụ osote onyeisi omeiwu nke Delta steeti.

Ha kwuru na ha chụpụrụ ya maka na ọ tụrụ asị banyere onye obodo ọ bụ.

Nchụpụ a na-abịa n'agbanyeghị na ọ nọọla n'ọnọdụ ahụ afọ atọ.

Achọtala ọfọ sineeti

Image copyright Nigerian Senate/ Facebook
Nkenke aha onyonyo Ike Ekweremadu nọchiri Bukola Saraki na nzukọ ebe a bịara buru ọfọ a

Ndị uweojii kwuru na ha achọtala ọfọ ndị sineeti ndị omekome zuru ụnyaahụ.

Osote ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abuja bụ Aremu Adeniran kwuru nke a n'akwụkwọ ndepụta ha wepụtara n'ụtụtụ a.

O kwukwara na onyeisi ndị uweojii gburugburu Naịjirịa nyere iwu ka ndí uweojiie tinyekwuo uchu na nchekwa ụlọomeiwu ukwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

N'akụkọ mba ofesi

Image copyright Getty Images

Ndị ụlọakụ commonwealth nke Australia bụ CBA n'aha ịchafụ emeela nkwupụta etu ha si na-anara ndị nwụrụ anwụ ego.

CBA kwuru na ha naara ndị mmadụ ego na-enyeghị ha ihe ha chọrọ, ka a na-enyocha ha maka mpụ na nrụrụaka gbasara akụnaụba, n'ihu ohaneze.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Ndị Manchester United gosiri ndị Bournemouth nkarị n'abalị ka ha zutere na Premier league.

Ha ji ọkpụ abụọ asataghị ihe (2-0) merie bournemouth.

Man. Utd nọ n'ọkwa nke abụọ na tebulu ebe Bournemouth nọ n'ọkwa iri na otu.

Nkeji ụtụtụ a:

Gere akụkọ nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe nkịrị nke taa

Ihe onyonyo a na-egosi ka ndị mmadụ na-anwa ihe a na-akpọ 'Lion' n'Igbo.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị bụ "lion na leopard" n'Igbo?

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a