Lee onye e boro na aka ya dị n'ohi ọfọ ndị omeiwu sineti

Ovie Omo-Agege Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndịuweojii nwuchịkọrọ Omo-Agege, ma mecha rapu ya

Ndị wakporo ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa ụnyaahụ so Sịnetọ Ovie Omo-Agege banye ụlọ ọme iwu ukwu ahụ, ndị hụrụ mgbe ihe a mere na-akọwa.

Onye ntaakụkọ Premium Times kwuru na ya so Omo-Agege n'azụ mgbe ọ na-aba n'ụlọ ome iwu ukwu, o kwukwara na mgbe ndị akpụ obi a rụru ebe ndi uweojii na-echekwa ebe ahụ nọ, Omo-Agege gwara ha na ọ bụ ya na ha so.

Ndị uweojii ahụ hapụrụ ha niile ka ha gafe, agbanyeghị na ndị ome iwu machiri Omo-Agege ịbata ụlo omeiwu.

Mgbe ndị a wakporo ebe ahụ, ma maburu ọfọ, onweghị onwe uweojii maọbụ ndị omeiwu kwụsịrị ha.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị omeiwu zọrọ isi ha ka ndị ike bịara buru osisi ọfọ ndị sineti

Kedu etu ndụ akpụ obi siri wakpo ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa were buru ọfọ iwu ha gbapụ?

Ajụjụ a bụ ihe ndị mmadụ na-ajụ na Naịjirịa ugbua ka akụkọ pụtara unyaahu na Ovie Omo-Agege, bu onye omeiwu na anọchite ndị Delta Sentraal n'ụlọ omeiwu ukwu kpọrọ ndị akpụ obi ga mabụrụ ọfọ.

Image copyright Nigerian Senate/ Facebook
Nkenke aha onyonyo Onyeisi sineti bụ bukola Saraki anọghị oge mwakpo ahụ mere

Ihe a

na-egosi na nchekwa ulọ omeiwu ukwu adịghị etu okwesiri ị dị.

Gụọ maka onye a asị na aka ya di na mwakpo a.

Lee onye bụ Omo-Agege

Image copyright Reuters
  • Nwa Amadi a bu onye Delta steeti, ma na-anọchite anya ndị Delta Central n'ụlọomeiwu
  • Omo-Agege dị afọ 54 ma zọọ ọchịchị ịbụ aka na-achị Delta steeti n'afọ 2007 na 2011 mana onwetaghị ya
  • Omo-Agege bụ onye ọkaikpe, ọ gara akwụkwọ na mahadụm Binin (1985) na mahadụm ọkaikpe nke Tulane (2002)
  • Ọ nọbụ n'otu pati Labour, mana ka ọ nwetara oche ụlọ ọmeiwu ukwu, ọ gbagara pati na-achi bụ All Progressives Congress (APC)
  • Okwa ọchịchị mbụ o nwetere na Naịjirịa bụ ode akwụkwọ nke Delta steeti n'afọ 2007, ọ rụrụ ọrụ a otu afọ
  • Ndị omeiwu ukwu nyere Omo-Agege ntarama ahụhụ sị ya kwụsị ọrụ ruo ubọchị 90 n'Epreelụ 12 nke afọ a maka na ọ kpọrọ ndị omeiwu ukwu gaa ụlọ ikpe. Onyeisi ndị Sịneti bụ Bukola Saraki kwuru na ịkpụpụ Sịnetị ụlọ ikpe bụ mkparị. Ufọdụ mmadu na-akọwa na ọ bụ nkwụsị ọrụ a mere Ome-Agege jiri wakpoo ụlọ omeiwu ukwu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a