Onyeisiala agaghị akọli ụmụntorobịa Naịjirịa niile ọnụ

Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Amabeghi mgbe Buhari ga-alọa na njem o mere gaa London

Onye nkwuchiteọnụ onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina edeela akwụkwọ iji katọọ akụkọ na-agagharị na onyeisiala kọrọ ndị ntorobịa Naịjirịa ọnụ na ha achọghị ịrụ ọrụ.

Akụkọ ahụ pụtara ụnyaahụ ka onyeisiala nọ na mkparịaụka na ajụjụ na azịza nke ha mere ka e mesiri ọgbakọ ndị Commonwealth na London kwuo na ụfọdụ ụmụ Naịjirịa anaghị achọ ịrụ ọrụ maka na Naịjirịa na-emepụta mmanụ.

Ụmụ Naịjirịa buru akụkọ a n'igwe sọshal midia niile dịka ndị mmadụ na-ahụta ya dịka mkparị nye ụmụntorobịa Naịjirịa niile.

Mana n'akwụkwọ ahụ nke Femi Adesina dere, o kwuru na onweghi oge ọ ga-abụ mmasị onyeisiala Naịjirịa bụ nna Naịjirịa niile nakwa nwere ụmụ nke afọ ya ịkọ ụmụ Naịjirịa ọnụ.

Adesina kwuru na ọ bụ nghọtaghie ka a ghọtaghiere ihe onyeisiala kwuru ebe ọ rụrụ aka na ndị omekome burukwara akụkọ a n'ụzọ na-ezighiezi.

O kwuru na onyeisiala Buhari na-eto ụmụ Naịjirịa na-eme nkeọma na ngalaba dị icheiche oge niile ma ọ ga na-aga n'ihu na-emekwa nke a maka na ọ ma na ha nọ n'etiti ndụ Naịjirịa.

N'okwu ya, Onyeisiala Buhari kwuru; "Anyị nwere ndị ntorobịa karịọ́ n'ọnụọgụgụ, ọnụọgụgụ anyị dị ebe nde mmadụ 180 ma pasentị 60 n'ọnụ ọgụgụ ahụ dị afọ pekarịrị 30,

Ọtụtụ nime ha agabeghi akwụkwọ mana ha na-ekwu na Naịjirịa bụ mba na-emepụta mmanụ, nke a kpatara ha ga-eji nọrọ na-emeghi ihe ọbụla ma chere aka na-aghọrọ ihe ndị dịka ụlọ, ahụike na agụmakwụkwọ n'efu."

Adesina kwuru ka ndị mmanụ kwụsị iwepụ ihe onyeisiala na-ekwu jiri ya na-eme ihe ọchị maọbụ ekwugharị ya etu ọ na-apụtaghị n'ihi na ọ gaghị amịta mkpụrụ.

Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari gara London maka ọgbakọ ndị mba COmmonwealth an ihe ndị ọzọ ọ chọrọ ime.

Akụkọ ga-amasị gị: