E bugoola ndị uweojii 45 maka nwụchi Evans

Evans Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chukwudumeme Onwụamadike a.k.a Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa

Ndị uweojii ebugoola ndị otu ha ruru iri anọ na ise ya na ndị ọzọ e mekwara ihe ọma maka mbọ ha gbara n'inwụchị onye a na-enyocha maka ntọ mmadụ akpọrọ Chukwudumuje Onuoamadike, a.k.a. Evans na ndị otu ya.

Ndị uweojii a ebugoro gunyere ndị nọ ngalaba na-enweta amamihe gbasara ohi na mpụ ,ngalaba na-ahụ maka ihe eji nyocha mpụ na ohi nke nọ n'okpuru onyeisi uweojii na-ahu maka nyocha n'ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

Ndị uweojii sị na ha kpebiri ibugo ndị otu ha na nzukọ ha na onyeisi ha bụ Mike Okiro, onye bụbụ onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii ka ha nọ na mputa ụlọikpe eche ka kpecha ikpe Evans mbge jidechara ya ọfụọ

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ bụ Ikechukwu Ani kwuru n'akwụkwọ o depụtara "na mbugo a bụ maka ezigbo mbọ puru iche ndị uweojii ahu gbara n'inwuchi ndị ntọ yinyere ndị Naịjirịa ụjọ dị egwu.

O kwuru na ọ bụkwa iji wee mee ka ihe mbọ onye uweojii ọ bụla gbara daba n'ọkwa a na-enye ya.

O kwuru na dika Okiro sị kwuo na ọkwa ọhurụ a ga-akpalite mmuọ ndi uweojii a iji mee ọfụma ọzọ.

kedu ndị e bugoro?

Lee ndị nwetere mbugo:

DCP Habu Sani-onyeisi ndi uweojii na-ahu maka nyocha,onye nke ga-aputa maka mpakọrịta ụka gbasara ndị uweojii na-aba n'ọkwa kọmishọna

Ndị ọzọ bụ mmadụ abụo esi n'ọkwa enyemaka Kọmishọna uweojii bugo ha n'ọkwa osote Komishọna, otu onyeisi suparintendenti bara n'ọkwa enyemaka kọmishọna,otu suparintendenti bara n'ọkwa ọkachasị

suparintendenti,ndị enyemaka suparintendenti ruru iri na isii(16) bara n'ọkwa osote suparintendenti na ndị nyocha enyemaka suparintendenti.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara