Peter Obi: Ụnụ akpazịla agwa dịka Emperọ Nero nke Rome

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a:

Peter Obi agwala ndị ndu Naịjirịa ka ha kwụsị ịkpa agwa ka Emperor Nero nke mba Rome

Onye bụ bu Gọvanọ Anambra Steeti bụ Peter Obi agwala ụmụ Naịjirịa karịsa ndị ndu ka ha kwụsị ịkpa agwa dịka Emperor Nero bụ onyeisi mba Rome nọ na-akpọ ụbọ egwu ebe Rome na-agba ọkụ.

O kwuru na ndị Naịjirịa ji ụgwọ ruru ijeri dọlla iri asaa n'ime afọ iri akachapụrụ ụgwọ ndị ha ji.

Ọkaiwu Femi Falana kwuru na ndị omeiwu nwere ikike pụrụiche

Onye ọkaiwu ugwu ruru onye bụ Femi Falana ekwuola na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa nwere ikike izukọ ma ọfọ ọchịchị ọ dị ya ma ọ bụ ọdịghị ya.

O kwuru na-edere nke a n'akwụkwọ iwu Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

N'akụkọ mba ofesi

Ogbunigwe mgbagbu onwe agbara na kabul, bụ isi obodo Afghan ma gbuo mmadụ iri ise na asaa, ebe ọtụtụ merụrụ ahụ.

Nke a mere dịka ndị mmadụ na-edeba ha aha maka ntuliaka, ebe ndị IS kwuru na-aka ha dị na ya.

N'egwuregwu

Chelsea jiri ọkpụ abụọ chara acha a na-asataghị otu merie ndị Southampton iji tozuo oke n'agba nke ịkpeazụ asọmpi iko FA.

Ebe ha ga-ezute Manchester United n'ime abalị iri na itoolu nke ọnwa Mee.

Nkeji abalịa:

Gere akụkọ nke abalịa n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe nkịrị nke taa:

Aha onyonyo,

'Instagram e meela m ọgaranya' - Josh2funny