Ndị na-anata ọgwụgwọ ejichiela ndị dọkịta n'Enugu

Ụlọọgwụ Federal Neuropsychiatric bụ ebe ana-eme nyocha gbasara ọrịa isi mgbaka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ na-eme alụkwaghịm

Ndị na-anata ọgwu n'ọlụọgwụ ebe a na-agba ọkpụkpụ n'Enugu bụ nke akpọrọ National Orthopaedic Hospital na Bekee nwụchikọrọ ndị na-elekọta ha anya taa maka nkwụsị ọrụ.

Ndị ntaakụkọ gara ụlọọgwụ a kwuru na ndị a na-agba ọkpụkpụ na ndị metụtara ha gbachiri ọnụ ụzọ esi aba n'ụlọọgwụ ma mee ka ọnweghị onye bara n'ime ya.

Ụfọdụ n'ime ndị a na-anata ọgwụgwọ kwuru na a sịrị ha laa.

Ha kwukwara na ha akwụghị ụgwọ ha ji maka na ha ahụghị ndị na-ana ego, nke mere ka ndị nche gbochie ha mgbe ha chọrọ ịla.

Ha sịrị na ndị nche a chọrọ ka-egosi akwụkwọ eji gbapụta ha n'ụlọọgwu ahụ.

Otu onye na-anata ọgwụgwọ na-achọghị ka-amata aha ya sịrị na ọ bụrụ na ndị isi ụlọọgwụ ahụ akwanyeghị ụfọdụ ndị ọrụ ọkụ n'ike, o nweghị onye ga-aza ha.

Ọ gara n'ihu kwuo: "Ọ bụ onyeisi bịara ịnyere anyị aka na mgbede tọsday mana ọ maghị ebe akwụkwọ anyị dị. Ụfọdụ n'ime anyị na-anwụzị anwụ mana anyị enweghị ike ị ga ụlọọgwụ ọzọ ma ọ bụrụ na anyị akwụghị ụgwọ anyi ji ebe a."

Cheta na ndị ọrụ ụlọọgwụ so na ngalaba akpọrọ Joint Health Sector Union (JOHESU) na Bekee, bụotu jikọtara ndi na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ nke gọọmentị nwere, bidoro arụkwaghị m kamgbe ubọchị Wenesde nke izuụka a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a