Ego a na-atụ n'Imo agaghị aba akpa anyị - Okwuchite ọnụ Rochas

Rochas Okorocha na eze ndị Ogoni, King Godwin Gininwa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Agba ọchịchị Rochas Okorocha ga-agwụcha n'afọ 2019

Ka akụkọ na-akọwa na gọọmentị Imo steeti agwala ndị okenye niile tozuru ị rụ-ọrụ ha kwụọ naira puku atọ pụtara, gọọmentị Imo na-akọwa na ọ gbụghị ha ka ego a dị mkpa.

Ebere Iwuji bụ onye na-ekwuchite ọnụ gọvanọ n'ihe gbasara mgbasa ozi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ụgwọ a bụ ụgwọ a ga-akwụ nanị otu mgbe. O kwukwara na a ga-eji ego kwado ọrụ dị icheiche obodo ndị nọ n'ime Imo steeti ji aka ha na-eme.

Agbanyeghị na akụkọ na-ekwu na ọ nde naira isii ka eyiri otu obodo, Nzewuji sịrị na enweghị aha ego ọbụla akpọrọ, makana ọ ndị bi na imi obodo ugbua kwesịrị ịtụ ụtụ a.

Nzewuji si "Ego a gaghị abanye n'akpa gọọmentị Imo steeti, ọ bụ ngalaba obodo dị icheiche akporọ Community Government Council (CGC) nwe ya".

Nzewuji gara n'ihu kwuo na gọọmentị Imo steetị ga-eji nde naira iri wee kwado obodo ọbula tụrụ ego a, ka ha na-ele anya na a ga-eje ya hiba ụlọọrụ mepụta ihe na ihe ndị ọzọ obodo chọrọ.

"A nam eche na onye ọbụla chọrọ ọganiru ga-achọ ikwado ya, okachasị ebe ha na-etinye aka n'mbu na ọrụ mmepe obodo," Nzewuji kwuru.

Nzewuji gakwara n'ihu kọwa na onweghị eze obodo ọbụla anapụrụ ọgwọ onwa maka ihe a.

Gee nkọwa ya n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye na-ekwuchitere gọvanọ Imo steeti kọwara ihe ego ga-eme

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara