Ndị wakporo ọzụbụlụ chọrọ otu nde dọla

Mkpọ iwu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A wakporo ụlọụka st Philips n'ọnwa August n'afọ 2017

Otu onye aka ebe bụ Nkwado Onyeka bụ onye hụrụ mgbe awakporo ụlọụka St Philips dị n'Ọzụbụlụ agbala ama ọhụrụ n'ụlọikpe ukwuu dị na Nnewi.

Ọ kwuru na ndị a na-enyocha mere mkpamkpa a kwuru ka enye ha otu nde dọla site n'aka ndị Ọzụbụlụ nọ mba Sawutụ Afịrịka ka ha we kwusi ogbugbu mmadụ n'obodo ahụ tupu ha bia wakpo ụlọụka Katọlik akpọrọ St. Philips.

Onyeka onye bụbụ onyeisi otu a kpọrọ Ọzụbụlụ Development Union(ODU) na Sawutu Afịrịka gbara ụlọikpe nke nọzị n'Akwa ama na maka mkpesa mmanyeụjọ onye ọkaiwu ukwuu bụ Jay Jay Ezeuko na-ahụ maka ya bụ ikpe kpesara maka mmadụ abụọ (Gozila na Afam) ndị nọ na nga a na-enyocha kpara mkpamkpa a.

O kwuru na ndị a a na-enyocha gburu nwunye ya ma gbukwa ndị Ọzụbụlụ a ma ama ruru isii na Sawutu Afirika.

Onyeka kwuru na ndị a a na-enyocha si na ha ga na-egbu ndị Ọzụbụlu rue mgbe ha tọhapuru ha na nga.

Ọ gwara ụlọikpe ahụ otu ya na ndị otu ya sị gbaa mbọ ikwụsị mkpamkpa a mana ihe niile ha mere apụtaghị isi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: