Kedụ otu pati ndị ga-ekpoko iwepụ APC?

Olusegun Obasanjo Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Olusegun Obasanjo kwusiri ọchịchị n'afọ 1999

Ọtụtụ ndị otụ pati nọ n'ọkwa ọchịchị akpọrọ APC nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa na-agba mbọ ịwepụ ọchịchị n'aka pati Buhari na 2019.

Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ pati nwereike imalite ijikọ n'izuka na-abia iji wee kwusi mgbagọ ọbụla na ntuliaka na-abia nu.

Ndị gunyere na njikọta pati a bụ pati ndị a: 'Peoples Democratic Party(PDP), ụfọdụ ndị isi na All progressives Congress (APC), Social Democratic Pati,' ndị obere pati ndi ọzọ ruru iri abuọ na atọ

nakwa 'Coalition for Nigeria Movement (CNM) nke onye bubu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo .

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo APC were ọchịchị n'afọ 2015

Ndị bubu onyeisiala na Naịjirịa, ndị isi agha lagoro ezumike nka gunyere onye agha T.Y Danjuma na-akwado mkpokoba a.

N'ọnụ otu onye welitere isi na ya bụ mkpoko, "nke a agaghị adị ka mgbanwo mụtara pati APC. Anyị anaghị ezigara ụlọọrụ INEC aha mgbanwe. Pati ọhụrụ a ga-enye onye ọ bụla ohere ikwuputa obi ya."

Ndị nọ n'ụlọomeiwu na ndị govano ruru iri na itoolu na-akwadoka ya bụ mkpokoba.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo PDP chịrị Naịjirịọ́ afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị

N'aka nke ọzọ, pati PDP ka a na-atule ma ha ga-agbanwe aha pati ha. Onyeisi pati ahụ bu Uche Secondus kwuru na ya na ndị otu ya ka na-atule ya bụ echic

Mana ndị mmadụ na-ekwu na kama igbanwe aha, pati PDP weputa ụzọ dimma dị iche iche ha ga-esi dozie ala Naịjirịa ma wepu APC n'ọchịchị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: