Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Ndị wakporo ọzụbụlụ chọrọ otu nde dọla

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:

Ama ọhụrụ apụtala maka mwakpo Ọzụbụlụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ekpe ikpe gbasara ya bụ mkpamkpa kpara n'Ọzụbụlụ

Otu onye hụrụ mkpamkpa kpara n'ọzụbụlụ n'afọ gara aga agbala ama gbasara ya.

O kwuru na ndị wakporo ụlọụka St Philips dị n'ọzụbụlụ we gbusia imilikii mmadụ gwaburu ndị Ọzụbụlụ bị na mba Sawụtụ Afịrịka ka ha nye ha otu nde dola iji kwụsị mwakpo ahụ.

Saraki ekwuola ka e chekwaa ọchịchị onye kwuo uche ya

Onyeisi ụlọomeiwu sineti ekwuola ka ụmụ Naịjirịa hie asaa n'anya maa chekwa ọchịchị onye kwuo uche ya nke ọ nwetarala.

Image copyright Saraki/Facebook
Nkenke aha onyonyo A wakporo ụlọomeiwu sineti ụbọchị Wenezdee zuru ọfọ ha

Saraki nọrọ na Legos kwuo ka ụmụ Naịjirịa ghara ikwe ka onye ọbụla napụ ha ọchịchị onye kwuo uche ya.

O kwuru na ndị omekome nọ na sinetị chọrọ iwegharị ọchịchị sineti site na mwakpo ha mere ụbọchị Wenezdee mana ha emeghi ya nkeọma.

Onye sinetọ Ben Murray Bruze bụ onye nọchiri anya Saraki na Legos kwuru na a agaghị agbanwekwanụ ọchịchị sineti

Na mba ofesi

onyeisi mba Nọt Koriya bụ Kim Jong-un ekwuola na ya akwụsịla ịnwale ngwọagha nuklia nke ọ na-emepụta.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ele anya na Kim na mba US na mba Sawụtụ Koriya ga-enwe mkparịaụka n'oge na-adịghị anya

Kim kwuru na ya egosipụtala ikike ngwoagha nuklia nke Pyongyang ya bụ na ọ baghịzi uru ọbụla ịga n'ihu na-eme nwale.

Ha akagbuola otu nwale ha kwesiburu ime dịka ha na-akwado mkparịtaụka dị n'etiti ya na Sawụtụ Koriya na mba Amerịka.

N'egwuregwu

Ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Alex Iwobi etoola onye nkuzi otu egwu bọọlụ Arsenal bụ Arsene Wenger n'afọ niile o nyerela otu egwu bọọlụ ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Arsene Wenger anọọla afọ 22 n'otu egwu bọọlụ Arsenal

Wenger ga-esi n'otu egwu bọọlụ ahụ pụọ na ngwụcha agba a dịka ọ nọrọla ebe ahụ afọ iri abụọ na abụọ.

Arụmụka na-aga n'otutu ebe ugbua bụ oney ga-anọchị Wenger.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ.