Nọt Koria akwụsịla mwale ngwọagha nuklia - Kim Jong-un

Kim Jong-un Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ele anya na Kim ga-akwụsị imepụta ngwọagha nuklia kpamkpam

Onyeisiala mba Nọt Koria bụ Kim Jong-un ekwuola na ya akwụsịla mwale ngwọagha nulia ha chọburu ime ma mechikwaa ebe ha chọrọ ime nwale ahụ.

N'okwu ya; "Bido n'ụbọchị 21 ọnwa Epreelu, Nọt Koria ga-akwụsị nnwale nuklia."

Kim kwukwara na nnwale ọhụrụ adịghịzị mkpa maka na ya egosipụala ikike ngwọagha nuklia nke Pyongyang.

Nkwupụta a nke tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya na-abịa dịka Nọt Koria na-akwado mkparịtaụka pụrụiche nke ya na mba Sawụtụ Koria na mba Amerịka nwere.

Kim kwesiri izute onye otu ya bụ onyeisiala mba Sawụtụ Koria Moon Jae-in n'izuụka na-abịa maka mkparịtaụka nke dị n'etiti mba ndị Koria abụọ ahụ nke a na-eme kamgbe ihe ruru afọ iri, ya na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ga-enwe mkparịụka nke ha n'ọnwa Juunu.

Mba Sawụtụ Koria na mba Amerịka na-akwanye mba Nọt Koria kamgbe ka ha kwụsịngwọagha nuklia dịka ha gosipụtara nkwado nye Kim na nkwupụta ọhụrụ a.

Trump nọọ'akara twitter ya gosi aṅụrị ya gbasara nkwupụta nke Nọt Koria dịka o kwuru na ọ bụ ezigbo agamnihu nye mba Koria niile ma na-ele anya maka mkparịtaụka ha.

N'akụkụ nke ya, ndị Sawụtụ Koria kwuru na ihe ndị Nọt mere bụ ezigbo agamnihu nke ga-amịta ezi mkpụrụ na mkparịtaụụka nke na-abịa.

O teela mba ụwa na-arịọ ka Nọt Koria kwụsị nnwale ngwọagha nuklia ha ebe Amerịka kwuburu na ha dị nkwade ibuso Nọt Kọria agha ma ọ bụrụ na ha kachie ntị.

Mana mkparịtaụka nke Sawụtụ na US ga-eme ga-abụ mbụ n'ọtụtụ afọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: