Akụkọ kachasị n'ụtụtụ: Buhari alọghachitala Naịjirịa

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Onyeisiala Muhammadu Buhari alọtaala Naịjirịa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari kwupụtara ebumnobi ya ịzọgharị ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliak 2019

Onyeisiala Muhammadu Buhari alaghachitela na Naịjirịa ụnyaahụ kemgbe ihe karịrị otu izuụka ọ pụrụ gaa London.

Njem ya bụ maka ọgbakọ ndị isi mba Commonwealth nakwa mkparịtaụka ya na Theresa may nwere.

Ndị ọchehi a chọrọ ikpochapụ obodo ndị na Benue?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A wakporo obodo ise n'ime Guma LGA nke Benue Steeti

Akụkọ na-ekwu na ha wakporo ụfọdụ obodo dị n'okpuru ọchịchị Guma dị na steeti ahụ ụnyaahụ wee gbuo ihe ruru mmadụ iri abụọ ebe ha gbara ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ ọkụ.

Mba Frans na-atụ ụjọ mkpochapụ

Image copyright Getty Images

Ọtụtụ ndị a ma ama na mba France ebinyela aka n'akwụkwọ arịọ ka etinye ọnụ n'okwu ndị na-achọ ikpochapụ otu agbụrụ na mba ha.

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'akụkụ dị icheiche na mba ahụ kwuru na ha chọrọ ka a mara ihe a ga-eme ndị obi na anụ ọkụ nime ndị na-akpọ isiala

Ihe onyonyo BBN ga-abị n'isi njedebe taa.

Image copyright BBNNaija/ Twitter

Dịka ihe onyonyo na-eme na Naịjirịa ugbua bụ Big Brother Naịjirịa na-abịa n'isi njedede taa, ọtụtụ na-ajụ kedụ onye ga-eri ngo nde naịra iri anọ na ise ahụ.

Ọ bụ Alex, Tobi, Nina, Miracle ka ọ bụ Cee c?

N'egwuruegwu

Image copyright Getty Images

Barcelona meriri Sevilla ọkpụ atọ asataghị ihe wee buru iko Copa del Rey nke ugbo anọ n'usoro.

Sevilla agbalịla imeri Barcelona ugboro asatọ mana o kweghi ha.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa:

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Instagram e meela m ọgaranya' - Josh2funny

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a