Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20

Mwakpo Benue Steeti Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A wakporo obodo ise n'ime Guma LGA nke Benue Steeti

Ndị Fulani na-achị ehi wakporo Saghev dị n'okpuru ọchịchị Guma nke Benue steeti gbuo ihe karịrị mmadụ iri abụọ n'abalị Fraịde nakwa isi ụtụtụ Satọde.

Ndị mwakpo ahụ gbakwara ọtụtụ ụlọ na ọdọ ahịa ọkụ.

Ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ steeti ahụ bụ Terver Akase gwara BBC na ọ bụ ndị na-achị ehi mere mwakpo ahụ dịka ọtụtụ ndị bi n'obodo hụrụ ha siri kwuo.

Akase na obodo ndị ha wakporo gụnyere Tse-Abi, Tse-Ginde, Tse-Peviv, Tse-Ikyo, Agenke and Gbenke.

O kwuru na-agbanyeghị na Gọọmentị Benue na-agba mbọ inyere ndị uweojii aka n'inye ha nkwa ọrụ, iji belata ogbugbu ndị mmadụ, kama chi na-abọ a na-anụ ọzọ.

Akụkọ kwuru na onwebeghị ihe ndị uweojii kwuru banyere nke a.

N'otu aka ahụ, opeka mpe, mmadụ isii anwụọla n'ọgụ dapụtara n'etiti ndị APC na steeti ahụ, ebe ọtụtụ merụrụ ahụ n'ọgbakọ imeezi ngalaba Benue Sawụtụ nke pati ahụ nwere.

Ụlọọrụ akụkọ Guardian kwuru na ọgụ dara n'etiti ndị na-akwado onyeisi oche pati ahụ na steeti ahụ bụ Comrade Abbah Yaro, na onye nnọchiteanya mpaghara ahụ n'ụlọomeiwu nke nta (Ado/ Okpokwu/ Ogbadibo) bụ, Hassan Saleh.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: