Ezeife: Ndigbo ga-ajụ Buhari ọzọ

Chukwuemeka Ezeife na okenye ndị Igbo ụfọdụ Image copyright Chinedu Asuzu
Nkenke aha onyonyo Chukwuemeka Ezeife,onye Igbo-Ukwu bụbu gọvanọ na Anambara Steeti bụ otu onye na-ekwuchitere Ndigbo na Niajiria

Ndị nwere agba n'ala Igbo ekwuola na ụmụafọ ịgbo ga-ajụ nkwado onyeisiala Buhari na ntulika nke 2019 dịka ha mere n'afọ 2015.

Ha dọrọ Ndigbo aka na ntị ka ha mata na ngwa na ọ bụrụ na ha kwado onyeisiala Buhari ka ọ banye n'ọchịcihị ọzọ n'afọ 2019 na ọkwa onyeisiala ga-erute Igbo aka bụ nkwa a na-ekwe nwaanyị n'elu akwa, nihi na ọ bụ okwu aghụghọ.

Na nsọnsọ, otụtụ ndị otu APC gụnyere, Minista na ahụmaka njem bụ Rotimi Amaechi, onye odeakwụkwọ nke gọọmenti etiti bụ Boss Mustafa na kwa onyeisi ndị ụlọọrụ Voice of Nigeria nbụ Ọsita Okechukwu gwara Ndị Igbo ka ha tụnyere Buhari na'afọ 2019, ka oke were rute ha na 2023.

Mana ụfọdụ ndị nwere ọnụ n'igbo kwụrụ na okwu ahụ bụ okwụ aghụghọ iji nweta votu Ndigbo, kwụkwọ na ndị dịka Buhari bọrọ ndị Igbo maka entinghirị ya akwụkwọ n'afọ 2015, na ha agahị enyere ya na ntuliaka 2019.

Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Sun nwere onye chịbụrụ Gọvanọ n'Anambara Steeti bụ Dr Chukwuemeka Ezeife si: "A hụghị ka ọ ga e si mee. Echeghị na anyị kwesịrị ị na-arịọ ndị mmadụ ọkwa onyeisiala. Uche m bụ na anyị ga-aga rịọ Chineke, Onye mara na ọ bụrụ na onye Igbo were ọkwa dịka onyeisiala, obi ga-adị ndị Fulani mma, dị ndị Yoruba mma, dịkwara ndị mpaghara dị ichiche na Naijiria mma n'ihi na anyị ga-ahazigharị ọnọdụ akụnaụba Naijiria ka ọ ga n'ihu. Ikwu maka 2023 bụ okwu akwụghị ọtọ, onye ọbụla na-ekwu ya bụ iji ghọgbụ Ndịgbo."

N'otu aka ahụ, onye bụbu onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Dozie Ikedife, kwuru na Ndigbo bụ ndị ekwerela nkwa inweta ọkwa onyeisiala apụtaghị ihe ọbụịla n'oge gara aga.

Ọ gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Sun sị: "E kwela Ndigbo ọtụtụ nkwa dị otu a n'oge gara aga, aghọgbukwara ndị be anyị. Ọ bụrụ na mmadụ ghọgbụo gị ụgboro abụọ ma ọ bụ atọ, ọ bịa nke anọ, i cheba echiche ime. Ike ala a agwụla mmadụ.

Ikedife gara n'ihu kwuo sị : "Ihe bụ mkpa m bụ otu a ga-esi gbaso iwu na mkparitaụka nweta Biafra na alụghị ọgụ maọbụ kpalia onye ọbụla."

Cheta n'afọ 2015, ọtụtụ Ndigbo atụnyerịghị Buhari akwụkwọ ntuliaka nke mere ka mere o jiri si na ya aghị nye ndị nyere nkwado pasent 95 na ndị nyere ya pasent ise otu ụgwọ, okwu ọtụtụ na-eche o mezuru site ndị o nyere ọkwa ọchịchị kemgbe ọ banyere n'ọchịchị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a