Nwoke gba ọtọ awakpoola ụlọoriri na mba Amerịka

Ụlọọriri ebe ihe ahụ mere Image copyright @MNPDNASHVILLE
Nkenke aha onyonyo Ndị uweoji chọtara egbe eji wakpo ụlọọriri a

Ndị uweo ji kwuru na otu nwoke gba ọtọ egbuola mmadụ anọ n'ụlọoriri dị n'obodo Nashville na mba Amerịka.

Nwoke ahụ tibara n'ime ụlọoriri ahụ ebe elekere asatọ nke ụtụtụ n'Antioch ma malite ị gba ndị mmadụ egbe.

Mmadụ anọ ndị ọzọ merụkwara ahụ tupu onye ọzọ na-eri nri ebe ahụ anapụ ya egbe oji, o we gbapụ ọsọ.

Ndị uweoji enyela aha nwoke ahụ ka Travis Reinking dị afọ iri abụọ n'itoolu bụ onye si obodo Illinois ebe ha jisiike na-achọ ya.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a