Naeto C: Ịlụ nwaanyị abụghị ihe egwuregwu
Naeto C: Ịlụ nwaanyị abụghị ihe egwuregwu
BBC Igbo na Naeto Chikwe nwere mkparịta ụka, ebe agbara ya ajụjụ ihe mere anaghị anụzi olu ya n'iti egwu.
Naeto C kwuru na ọ bụ maka na ọ lụrụ nwaanyị, ya wee sị ka olekwasị ezinaụlọ ya anya.
O kwuru na ezinaụlọ ya dị ya mkpa karịa iti egwu.
Naeto C gara n'ihu kwuo na ịlụ nwaanyị abụghị ihe egwuregwu ma ọ bụ ihe onye ama ama, kọwa na ọ chọrọ ime ya n'ụzọ dị nma.
Mgbe ajụrụ ya na ọ bụ ọgaghị etiizi egwu ọzọ.
Naeto C kwuru na ọ ka nọ n'ụlọ egwu ugbua, n'ọhụrụ a ya na Phyno nakwa Sarkodie etiela egwu.
Mana ọ dị zighị ka mgbe ọ pụtara ọhụrụ, nke bụ kwa ọnwa ya tie otu egwu.