Soyinka: Saanụ anya mmiri na 2019

Wole Soyinka
Nkenke aha onyonyo Wole Soyinka adọrọ ndị Naijiria aka na ntị ka ha

Wole Soyinka bụkwa odee akwụkwọ a mara amara adọọla ndị Naịjirịa aka na ntị ka ha saa anya mmiri ghara ikwe ka ndị ndọọndọrọ ọchịchị ghọgbu ha ọzọ na ntuliaka na-abịa n'afọ 2019.

Soyinka, onye nke kwuru nke a ụbọchịụka n'emụme ncheta ọmụmụ onye ọkaiwu a mara amara nwụrụ anwụ bụ Gani Fawehinmi nke e mere na Legọs kwuru na obodo Naijiria na ọchịchị onyekwuoucheya nọ na nsogbu ugbua.

Ọ si na ndị tinyere Naịjirịa na nsogbu ọ nọ na ya ugbua site na atụmatụ ha, e jikerela onwe ha ọzọ dịka ndị nzọpụta ka ntuliaka na-abịa., ma dụọ ndị Naijiria ọdụ ka ha jụ ndị ndọrọndọrọ ochie iji nye ohere ka ndị agba ọhụrụ were ọchịchị.

Ọ sịrị: "A naghị enyo ya enyo na ọchịchị onyekwuoucheya nọ na nsogbu. Ọ bụghị sọsọ ọchịchị onyekwuoucheya, obodo anyi nọ na nsogbu. Echeghị m na o nwere oge na ndụ niile n'ụwa , ọkachasị n'ala a oge nchere ihe niile dakpọrọ adakọ otu a. Anyị niile maa nke a.

"Ajụjụ bụ anyị ana-ahụ ya dịka ohere nzọpụta ka anyị a na ahụ ya ha ohere ị ga n'ihu na-eme ihe ndị ahụ mere na ala anyị na akpụ afọ n'ala? ọ bụghị akụkọ ọhụrụ mkpa ọ dị imee ihe ga-azọ ịdịkọnotu ala Naijiria.

"Ọ bụ ihe mgbagwojuanya na ndị bụ ndị iro ọchịchị onyekwuoucheya ndị ji aka ha webata atụmatụ nke butere anyị n'ọnọdụ anyị nọ taa bụ ndị pụtara na egosi onwe ha dịka ndị nzọpụta nke ala Naijiria na-ele anya, obodo nweere ọnụọgụgụ mmadụ nde 200."

Soyinka gara n'ihu dụọ ndị Naijiria ọdụ ka ha saa anya mmiri iji gbalahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

"Ọ gbara m gharịị na ka a na-ekwu okwu ịzọpụta ala Naijiria, otu otu maọbụ abụọ pụtara ndị nwere ndị nọ n'isi ya na eso. A na ma agwa ndị mmadụ ka ha na-enyo ha enyo n'ihi ndị na awanye onwe ha na otu ndịa bụ ndị soro dowe Naijiria na ọnọdụ ọchịchị onyekwuoucheya nọ taa."

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a