Ihe atọ inwe ọtụtụ ọnụ mgbanwe ego na-ebute

Naira Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị

Iji mee ka mgbanwe ọnụ ego Naijiria kwụdosie ike, IMF adụọla Naijiria ọdụ ka o jikọta mgbanwe ego ya ọnụ.

Naijiria nwere opeka mpe mgbanwe ego ise ; otu maka ndị na-atụbata mmanụ ụgbọala na Najiria, otu maka ndị ụkaalabụkụba na-aga njem okwukwe na Saudi Arabia, otu maka ndị ụka Kraist na-aga ala nsọ, ọzọ maka ndị na-agụ akwụkwọ na mba ofesi na otu ọnụ nke gọọmenti hiwere.

Dịka ndị ọkacharamara n'okwu akụnaụba bụ Pat Utomi na Uche Uwaleke siri kọwara onyentakụkọ BBC, inwe ọtụtụ mgbanwe ego nwere ọghọm.

Lee ụfọdụ ọghọm inwe ọtụtụ mgbanwe ego:

1. Ọ na-ebute mmerụaka

Pat Utomi kọwara na ọ na-eme " Onye maa mmadụ enwe ohere igote ego n'ọnụala ma were ya tụọ mgbere, mana onye nwere mkpa ego ahụ iji tubata ihe ọ ga-eji mepụta ngwa ahịa n'ala anyị na amaghị mmadụ ọ gaghị eru ya aka. Ọdịghị mma maka ọganihu azụmahịa."

N'okwu ya, Uwaleke nyere ọmụmatụ sị, "Dịka ọnụ ego mgbanwe nke gọọmenti bụ N305 , e resi mmadụ n'ọnụ ahụ, o nwere ike hapụ ihe a sịrị ya gote, resi ya onye ọzọ N365, nweta ọmụrụnwa.Mana ọ bụrụ na e nwere otu mgbanwe ego, ị gaghị enwe ike iregharị ya."

2. Ọ na-emenyụ ọkụ itinye uchu na imepụta ihe n' obodo.

Uwaleke sịrị na inwe mgbanwe ego dị ọtụtụ na-eme ọtụtụ ha dị uwengwụ. 'Sọọsọ ihe ha ga na-eme bụ ire ego dị ọnụala, agahị na-enwe mmepụta ihe.'

3. Ọ na eweda mmụbanye akụnaụba obodo

Utomi kwuru na "ọ bụrụ na ndị mmadụ na-enweta ego mgbanwe ego n'ọnụ ala iji ziga nwa ha obodo oyibo maka ịgụ akwụkwọ, ọ ga-eme ka onye ọbụla chọọ iziga nwa ya obodo oyibo, ụlọ akwụkwọ ndị dị n'obodo anyị ga akpụ afọ n'ala. Mana ha go ya n'ọnụ otu mgbanwe ego, ọ ga-eme ka ọtụtụ ego a na-etinye n'aguakwụkwọ na Naijiria jenite."

N'afọ ole na ole gara aga, Naijiria nwere nsogbu mgbanwe ego dịka akụnaụba ya kpụrụ afọ n'ala n'ihi ọdịda ọnụ ahịa mmanụ agbidi n'ahịa mba ụwa.

Ọ bụ ọnọdụ a mere na, dịka Uwaleke siri kwuo, ọ gaghị adabara Naijiria iso ndụmmọdụ IMF nyere.

Uwaleke kwuru na ọ bụrụ na Naijiria nwe ya ugbua, na ọ ga arịa ya ahụ ịkwụ ụgwọ o ji na mba ofesi n'ihi n'ọ ga a dịrị ya oke ọnụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a