Akụkọkachasị n'ụtụtụ a: Gọọmentị e bola ndị ndọrọndọrọ ebubo

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:

bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado ndị ji egbe na-egbusi mmadụ - Gọọmentị

Image copyright Getty Images

Ọnụ na-ekwụchitere onyeisiala bụ Garba Shehu ekwuola na gọọmentị etiti nwere ihe igbaakaebe, na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado ndị ji egbe na-egbusi mmadụ na steetị dị na mpaghara etiti ugwu-awụsa.

Shehu kwukwara na Muhammadu Buhari chọrọ isonye n'ịzọ ọchịchị na 2019 maka na ọchọghị ka ndị otu pati ọzọ mebie ihe ọma niile o mere na Naịjirịa kemgbe ọ batara ọchịchị na 2015.

A nwụchiela Dinọ Melaye

Image copyright @dino_melaye

Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na-anwụchiri Sineto na-anọchite anya Kogi Centralụ bụ Dịno Melaye ka ọ na chọ ịga mba Morocco na ụtụtụ a.

Melaye bụ onye kwupụtara nke a n' igwe okwu Twitter.

Ọ sị: "A nwụchiri m ugbu a dịka m nọ na ọdụ ụgbọelụ Nnamdi Azikiwe na-akwado ịga Morocco maka ozi nke gọọmentị etiti zigara anyị."

Ọgwụ esuula na ndọrọndọrọ ọchịchịAPC nke Abia steeti

Image copyright Getty Images

Otu abụọ na-azọ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị APC n'Abia steetị anụọla nnukwu ọgụ ma merụe ọtụtụ mmadụ ahụ.

Ndị nọ n'isi otu ndị a bụ Emmanuel Ndukwe na Donatus Nwankpa.

Ha na-azọ ọkwa a kemgbe Emmanuel Ndukwe wetere akwụkwọ ụlọikpe chụpụrụ Donatus Nwankpa dịka onyeisi ndị APC steetị ahụ.

Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị uweojii bịara ọsịsọ gboo ọgụ zọrọ ọtụtụ mmadụ imerụ ahụ.

France na iwu ọhụrụ a

Image copyright Emmanuel Macron

Mba France emeputaala iwu kwuru na onye ọbụla sị azụ ụzọ bata ala ha ga-aga mkpọrọ otu afọ.

Ha kwukwara na ha emeputaala iwu ga-enye ndị na-agba ọsọ ndụ enyemaka maka inweta akwụkwọ obibi n'ala ha.

Mana ndị otu na-alụ ọgụ maka ikike dịrị mmadụ nke ala France kwuru na iwu nke ụlọmkpọrọ tara ezigbo akpụ.

Mohammed Salah bụ onye ọgbabọọlụ kachasị

Image copyright Getty Images

Mohammed Salah onye otu egwuregwu bọọlụ Liverpool eturula ugo dịka onye ogbabọọlụ kachasị n'ime dị ogbabọọlụ n'afọ a.

Salah dị afọ iri abụọ na ise enyeela ọkpụ ruru iri atọ na otu n'ime asọmpị iri ato na atọ.

Mohammed Salah onye otu Liverpool eturula ugo dịka onye ogbabọọlụ kachasị n'ime dị ogbabọọlụ n'afọ a.

Salah dị afọ iri abụọ na ise enyeela ọkpụ goolu ruru iri atọ na otu n'ime asọmpị iri ato na atọ.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Isiokwu Ndị Emetụtara