Lee nri di iche iche esi n'akpụ emepụta

Akpụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ na mba Afrika na-eri akpụ

Akpụ bụ nrị a na-erikarị na mpaghara Afirika, Asia na Saụtụ Amerika makana ọ dị ebe niile dị kwa ọnụala na ebe ndị a.

Akpụ na-enye ahụ ikikere na-emekwa ka ahụ kpuo ọkụ etu o kwesiriekwesi.

E nwereike ị bacha ya, sie ya, ghe ya eghe, gbakpọ ya maọbụ baa ya na mmiri.

E nwere akpụ na-atọ ụtọ ma nwee kwa nke na-elu inu.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Akpụ a na-akwado iyọ

Akpụ tọrọ ụtọ nwere Kemikal sinaid na-erughị 50mg n'otu kilogram mana akpụ na-elu ilu nwere sinaid ruru 400mg n'otu kilogram.

Lee nri ụzọ ole na ọle eji akpụ emepụta:

A na-eji akpụ eme Abacha:

Image copyright 9jaDelicacies/Instagram
Nkenke aha onyonyo Abacha bụ nrị e jiri mara ndị Enugwu steetị

Akpụ asụrụ asụ:

Nkenke aha onyonyo Akpụ asụrụ asụ

A na-eji ya emeputa achịcha

Nkenke aha onyonyo Achịcha bụ ihe ọtita ndị Naịjirịa na-eri karị

Akpụ mmiri

Nkenke aha onyonyo Akpụ mmiri so na otu ihe ọtụta eji akpụ eme.

A na-eji akpụ emeputa Gari

Image copyright Yetunde Olugbenga
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị Naịjịria ejighị Gari ọṅụṅụ egwu egwu

Supageti

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Akpụ bụ nnukwu nri na Afirika

Eji akpụ ese nrị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-eji karị ofe ọgbọnọ eri nrị osise

A na-akwọ akpụ were ya mee ọtụtụ ihe

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Akpụ akwọrọ akwọ

Ihe ndị ọzọ ị na-amaghị maka akpụ:

  • Eji Akwụkwọ akpu esi nri
  • Akwụkwọ akpụ nwre protin karịa mgbọrọgwụ ya
  • Tupu erie akwụkwọ ya a ga-esiriri ya n'ọkụ ma wufuo mmiri ya
  • Akpụ dị mma n'ahụ onye na-achọghị gluten
  • Akpụ na-achụpụ ibu makana ọ na-eme ka agụrụ ghara igụ mmadụ.
  • A na-eji akpu akwọrọ akwọ eme ka anụ ahụ na-akwọ murumuru
  • A na-eji mgborogwu akpụ eme ka ụburu rụọ ọrụ ọfụma
  • A naghị eri akpụ maọbụrụ na-esighị ya n'ọkụ nke ọma.

Nri eji akpụ emepụta karịrị akarị. BBC Igbo ga-achọ ka ị setere ihe onyonyo nri ndị eji akpụ eme na obodo ụnụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: