Akụkọ kachasị n'abali: Ezenwaanyị mba UK enwetala nwa ọhụrụ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Dino Melaye na ndị uweojii

Dino Melaye na ndị uweojii na-akwata kamgbe ụtụtụ taa.

Dino Melaye nọ n'akara ya na Twitter depụta na ndị uweojii ruru mmadụ iri atọ bu egbe wuchiri na be ya na Maitama dị n'Abuja.

Mana ha tọhapụrụ ya ebe ha jideburu ya n'ọdọ ụgbọelu dị n'Abuja n'ụzọ ka ọ chọrọ ịga Moroko.

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị uweojii na-ahụ maka mba dị icheiche bụ ndị nwụchiri ya.

Naịjirịa amaala ihe ha ga-eji ego Abacha mee.

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola ihe ha chọrọ iji ego ruru nde dọla 332 Abacha zuru oge ọ nọ n'ọchịchị nke ndị gọọmenti Swiz weghachitere na Naịjirịa.

Mịnịsịta okwu ego dị n'aka bụ kemi Adeosun kwuru na a ga-eji ego nye ndị ụbịam dịka onyeisiala Muhammadu Buhari kwere na nkwa oge ọ na-azọ ọchịchị.

Egbuola nwafọ Naịjirịa ọzọ na mba Sawụtụ Afịrịka.

A gbaala nwa Naịjirịa ọzọ ọkụ n'obodo Rustenburg dị na mba Sawụtụ Afịrịka dịka igwe mmadụ ahụ a gbasịrị ụgbọala ya ọkụ.

Onyeisi otu ụmụ Naịjirịa bi na Sawụtụ Afịrịka bụ Adetola Olubanjo kwuru nke a.

Nke a bụ nke mere ọhụrụ a na agha ndị mba ahụ na-ebuso ndị Naịjirịa bi n'obodo ha.

Ndị uweojii na Sawụtụ Afịrịka ekwukwala na ihe ahụ mere bụ eziokwu ebe ha kwuru na e nwere ebe abụọ ndị a na-amaghị gbara ụgbọala ọkụ.

Na mba ofesi ezinaụlọ ezenwaanyị mba UK enwetala nwa ọhụrụ.

Nwunye onye nlekọta Cambrij bụ Catherine amụọla nwa ọzọ.

Nwa nwoke ahụ a mụrụ na London taa bụ onye nke ise n'ụzọ ocheeze mba UK ma bụrụkwa nwa nke isii n'agbụụ nke agbụru anọ Ezenwaanyị Elizabeth.

N'egwuregwu, Rangers na Ifeanyị Uba FC

Ndị otu egwu bọọlụ Rangers nke Enugwu na otu egwu bọọlụ Ifeanyi Ubah gbara onwe ha onye laba onye laba na Nnewi.

Rangers nke Enugwu nọ n'ọkwa nke asaa ebe ha ji akra iri abụọ na anọ ebe ndị Ifeanyi Ubah nọ n'ogo nke iri na abụọ ebe ha ji akara iri abụọ na abụọ.

Nkeji nke mgbede a

Ihe nkiri nke taa

Akụkọ ndị ga-amasị gị: