Gọọmentị etiti ekwuola ihe a ga-eji ego Abacha zuru mee

Kemi Adeosun na Christine Lagarde bụ onyeisi oche na IMF Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kemi Adeosun na Christine Lagarde bụ onyeisi oche na IMF

Gọọmentị Naijiria akwadola iji ihe kariri dọlla nde dọlla narị atọ bụ ego Abacha zuru nke gọọmentị Swiss weghachitere ga-eme.

Minista na-ahụ maka ihe gbasara ego bụ Kemi Adeosun ekwuola na a ga-eji ego ahụ zụọ ndị ụbiam dịka Onyeisiala Buhari kwere na nkwa mgbe ọ na-azọ ọchịchị.

O kwuru nke a ebe ọ na-ezi ndị ntaakụkọ ozi na ngwucha nzụkọ ngalaba na-eke ego n'ụwa niile bụ IMF na-aha ịchafụ nke mere n'obodo Washington na Amerịka.

Adeosun sị kwa na-etinyela ego a n'akpa pụrụiche n'ụlọakụ Niajiria a kpọrọ CBN n'aha ịchafụ iji bido mepụta atụmatụ ndị ga-enyere ndị ogbenye aka.

Na ozi ọ na-agbasa, ọ sị na gọọmentị etiti nwere olileanya na ha mepụta atụmatụ ha bu n'obi, n'ihe ga na-adịri Naịjiria mma.

N'olu ya "Anyị tinye atụmatụ ndị a na mmepụta, akụ na ụba obodo Naịjiria ga-arị elu"