Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: A chụọla ndị ọrụ ụlọakụ Offa ise

Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a

A chụọla ụfọdụ ndị ọrụ ụlọakụ Offa

Image copyright Getty Images

'Otu n'ime ụlọakụ ndị ojiegbeezu wakporo n' Offa, Kwara steeti na nsonso a achụọla ndị ọrụ ha ise maka ihe nkiri ha zipuru ndị mmadụ na-egosi oge ndị ohi wakporo ụlọakụ ahụ.

Cheta na ndị ohi gburu mmadụ iri na asaa n'ụbọchị ise n'ịme ọnwa Epurelụ nke afọ a oge ha bịara zuo ohi n'ụlọakụ ise n'obodo ahụ.

EFCC anwuchiela Peter Nwaoboshi na Jonah Jang

EFCC ekwuola na Pete Nwaoboshi bụ sinatọ na-anọchịte anya Delta-North na Delta Steeti na-aza ajụjụ n'aka ha maka mpu na aghọghọ.

N'akụkọ nyiri ibe ya, EFCC nwụchikwara onye chịburu Plateau steeti n'oge gara aga bụ Jonah Jang maka ego ruru ijeri naira iri ha si na o mefuru oge ọ nọ n'okwa ọchịchị.

Otu nwoke egbuola mmadụ 10 na Canada

Image copyright Getty Images

Ndị uweojii n'obodo Toronto na mba Canada ekwuola na otu nwoke aha ya bụ Alek Minassian ejirila ụgbọala kụgbuo mmadụ iri ma merụọ mmadụ iri na ise ahụ.

Ha kwuru na ha nwụchiri ya naghị agbaghị mgbọ ọbụla.

Gernot Rohr adọọla ndị ozi asị aka na ntị

Image copyright Getty Images

Onyenkuzi otu Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ya manyere iwu na ndị otu ya ga-ebinyeaka n'akwụkwọ tupu ha esonye na ndị ga-asọ mpi Iko Mbaụwa na Rọshịa.

Rohr kwuru na ndị a na-ekwu ihe a na-achọ nnukwu nsogbu, na ya ga-akpụpụ ha ụlọikpe maọbụrụ na ha gaa n'ihu na-atụ asị a.

Nkeji nke ụtụtụ a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile