Ajujụ Chimamanda jụrụ Hillary ebulitela okwu feminizim ọzọ

Chimamanda Adichie
Nkenke aha onyonyo Adichie bụ onye na-agba mbo ihu na nwoke na nwaanyị nọ nhatanha

Feminizim na-ewu na Naịjirịa ka akụkọ pụtara na onye ode akwụkwọ ama ama bụ Chimamanda Adichie jụrụ Hillary Clinton, bụ onye zọbụrụ ọchịchị ka onyeisiala mba Amerịka, ihe kpatara ojiri "nwunye" bido ikọwa onwe ya na akara ya Twitter, ebe di ya bụ Bill Clinton emeghi etu a.

Hillary Clinton sara Adichie, were si ya "maka etu i jiri jụ ya bụ ajụjụ, a ga m atụghari etu m siri dey nkọwa onwe m n'akara Twitter."

Mana ebe Adichie na Clinton jiri okwu mee ihe ha ji mkparita ụka enyi na enyi, soshal midia Naịjirịa enwụrụọla ọkụ ka ndi mmadu na-etinye ọnụ na-ajụ ihe kpatara nwaada ahụ jiri jụọ ụdịrị ajụjụ ahụ, maọbụ ihe mere ojiri kwesi ịjụ ya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Hillary Clinton bụ onye ama ama maka nkwalite ụmụ nwaanyị

Hillary Clinton bụ onye ihe metụtara umum nwaanyị na amasị nke ukwuu. Etu ka Chimamanda Adichie jirikwa bụrụ onye ama ama dika onye kwenyere na nwoke na nwaanyị kwesiri ihatanha. Ihe bụ ihe o metụrụ ọnụ mgbe ya na BBC Igbo nwere Mkparịta ụka n'afọ a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChimamanda akọwapụtala onye "feministị" bụ

Ọdịzị ka ọ bụ akara "feminist" a ejiri mara Adichie mere ndi mmadụ jiri agbaka ahụ ma ya kwuo okwu ha na-ero na-osenyeghị n'ihe dị ha n'ụche.

Agbanyeghị na onye ajụru ajụjụ egosịghị iwe maọbu mgbaka ahụ banyere ajụjụ Adichie jụrụ, ụfọdụ ndị Naịjirịra jiri ya bụ okwu mere ọgụ.

Otu onye nwere akara @GreatGracious sị kama nwaada Igbo ga etinye isi an akwụkwọ ọ na-edere anyị, ọ nọ na-ekwu maka etu Hillary jiri kọwa onwe ya.

@KathleenNdongmo wetere n'okwu a, na-asi na okwu Adịchị amasighị ya,

Ka @AyoShonaiya na-akọwa na agbanyeghi na ya na-akwụ Adichie n'azụ, ajuju ya a adabachaghị.

Onwekwere ndị rụtụrụ aka na Barrak Obama dere na ya bụ nna n'akara Twitter ya.

Mana, onwere ndị ọzọ na-akwadọ ihe Adichie kwuru:

@Uduakisong na ajụ ndị na ewe iwe ihe mere ha jiri na-ewe iwe make iwe onye ọzọ were?

@MakiSpoke dere na ọtụtụ na ndị na-aba mba na Twitter ekiribeghị mkaprịta uka Adịchịe na Hillary nwere.

Ka @damola_ososanya na-akọwa na ụmụ okorọbịa na Twitter aghọtaghị ihe mkparịta ụka Hillary na Chimamanda pụtara.

Mana, nke kachasị n'okwu a bụ na Hillary Clinton kwetere na ya ga-edegharị nkọwa akara ya na Twitter maka ihe Chimamanda kwuru. Nke bụ, ka ndi mmadụ na adọkachasị onwe ya, nwaada a nọzị n'ọnọdụ onye tụgharị ụche nnụkwụ mmanwụ dịka Hillary Clinton, ma ya bụrụ na o me ka o si kwu.

Na ikpeazu, cheta na ọgbughị ta ka o bidoro, nne ya ochie bụ onye kwenyere na nwoke na nwaanyị kwesịrị ịnọ nhatanha, ihe ka o kwuru bụ "feminizim".

Gee ya ntị ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChimamanda bụ onye odeakwụkwọ a ma ama na mbaụwa

Isiokwu Ndị Emetụtara