Akụkọ kachasị taa: Buhari akatọọla ọnwụ ndị Fada na Benue taa
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Ndị uweojii n'Enugwu na-emebi ogbunigwe echi
Ebe foto si, Ebere Amaraizu
Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbala ama na-awakporo ụmụnwaayị na Enugwu
Ndị uweojii n'Enugwu ekwuola na ha ga-emebi ogbunigwe a chọpụtara liri n'ala site n'oge agha.
Akwụkwọ onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha ga-ebido imebi ogbunigwe ahụ echi.
Ndị ọchịehi egbuola ụkọchukwu abụọ na ndị ọzọ
Ebe foto si, Getty Images
Onweghị onye kweta na ihe ga-egbochi nsogbu gbasara ịchị ehi
Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu e gburu ndị ụka Katọlik na Benue taa.
Ndị ochiehi wakporo ụlọụka St Ignatius nke ndị katọlik wee gbuo ndị fada abụọ ndị na-aka ụka ebe ahụ.
Akpọrọla Dino gawa Lokoja
Ebe foto si, Getty Images/Dino Facebook
Ndị uweojii kwuru na ndị interpol bụ ndị na-enyocha Dino
Okwu dị n'etiti ndị uweojii na Sinetọ Dino Melaye abala agba ọzọ.
Ndị uweojii kpọrọ Melaye gawa Lokoja taa, ihe ndị mma na-ajụ bụ ma a ga-akpọgharị ya n'etiti ndị ohi?
Na mba ofesi
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla mba Iran aka na ntị gbasara ngwọagha nuklia.
Trump bụ onye na-ele onyeisi mba France bụ Emmanuel Macron ọbịa kwuru na nnukwu nsogbu ga-adịrị Iran ma ha bidogahrịa imepụta ngwọagha nuklia ọzọ.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Liverpool FC/Twitter
Liverpool ga anabata ndị AS Roma taa n'asọmpi ọkara ikpeazụ Uefa Champịọns ụkwụ nke mbụ ya.
Mohammed Salah nke Liverpool ga-enwe ohere izute ndị AS Roma bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ n'oge gara aga.
Nkeji nke mgbede a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo taa
Nwaanyị mụrụ ejima atọ mana ọ maghị ebe di ya nọ kamgbe ọnwa Disemba afọ 2017.
Naeto C: Ịlụ nwaanyị abụghị ihe egwuregwu