Mmemme Ọfalla n'ala Igbo.
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Gịnị ka mmemme Ọfalla pụtara n'ala Igbo?

Ọfalla bụ nnukwu emume onye Igwe na-achi obodo na achikọba otu mgbe na-afọ iji were nwee aṅurị na etiti ya na ndị ọ na achị.

Eze na-achị obodo na ndị ọ na-achị na-erikọ nri ọnụ oge ahụ ma nyekọrịtakwa onwe ha oninye dị iche iche.

Ọ na-enyekwa ma natakwa onyinye n'aka Eze ala dị iche iche ya na ha dị na mma.

N'ọfalla ka obodo ọbụla n'ala Igbo jị egosiputa njịrịmara ha dịka egwu, mmanwụ, nri, nakwa ọdịnala ndị ọzọ dị iche iche.

Lee mmemme ọfalla ndị Ibagwa Nike n'Enugwu steeti nke Eze ha bụ Igwe Emmanuel Ugwu chikọbara.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: