Akụkọ kachasị n'abalị a: Ndị omeiwu nta akpọọla Buhari

Akụkọ kachasị n'abalị a

Ndị omeiwu nta akpoola Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Ndị omeiwu nta akpọọla onyeisi ala Naịjirịa ka ọ za ajụjụ maka ọtụtụ ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa

Ha kwukwara na oge eruola mgbe Buhari ga-akpọ ndị ọchịehị a na-egbu mmadụ ndị agha oyi egwu.

Nghaghari iwe otu Krist

Ebe foto si, Getty Images

Otu ụka Krist akpọrọ Christian Association of Nigeria na bekee ekwuola na ha ga-eme nghagharị iwe na ekpere maka ntọghapụ Leah Sharibu na ndị umụakwụkwọ Chibok ndị Boko Haram jiri n'ubọchị uka na-abia.

Ha kwuru na ha na-eme ihe a maka ndị ụkọchụkwụ katolik abụọ ndị ochịehi bu egbe gburu na Benue steeti ụnyahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Otu Red Kross n'ala Kenya ekuola na nnukwu ide mmiri di n'etiti ala ahụ achụọla mmadụ ruru puku narị abụọ na bee ha.

Ha kwukwara na oke mmiri na-ezo n'ala ahụ nwere ike ịchupu puku mmadụ ndi ọzọ ma tochịe ụzọ.

Ha ka na-azọpụta ndị mmadụ na mpaghara ebe ahu ugbua.

Asọmpị Bayern Munich na Real Madrid

Ebe foto si, Getty Images

Bayern Munich na Real Madrid ga-asọ mpi n'abalị a n'asọmpị iko Champion League.

Nke a bụ ukwu nke mbụ. Chete na Liverpool meri Roma ọkpụ ise mana ha asatara abụọ.

Gere akụkọ mere n'abalị a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo,

Onye meriri ọrịa kansa

Gụọ akụkọ ndị ọzọ