Ọnwụnwa ọzọ abịaala Dino?

Ndị na-edenye aha na INEC Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo INEC na enyocha ndị denyere aha ntụliaka n'obodo Kogi West dịka iwu si kwuo

Ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naijiria bụ INEC n'aha ịchafụ ebidola usoro iji wepu Sineto Dino Melaye n'oche ọchịchị n'obodo ya bụ Kogi.

Onye na-anọchite anya INEC na Kogi steeti bụ Ọkachamara James Apam kwuputara nke a taa ebe ha bidoro ị nyocha ndị denyere aha ntụliaka n'obodo ya.

Cheta na ụlọikpe enyebula INEC ikike ị ga niru were bido nwepu a a ga-eme Melaye ga-ebido n'ezie n'ụbochi satọday na-abịa.

Dino Melaye bụ sinetọ ndị uweojii na-agba mgbo ị nwuchi ka ọ zaa ajụjụ maka okwu ụgha ọ gwara ndị uweojii na ndị omekome wakporo ụgbọala ya.

Ndị ụlọọrụ sineti sọnyere osote onyeisioche ha bụ Bala Na'Allah ị ga leta Dino Melaye ebe ọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.

Akụkọ kwuru na ọ merụrụ ahụ ebe ọ na-achọ ị gbapụ ọsọ nwere onwe ya n'aka ndị uweojii mgbe ha kpụ ya a ga ụlọ mkpọrọ.

Image copyright @sumner_sambo
Nkenke aha onyonyo Melaye ebe ebu ya aga ụlọọgwụ

Minista ochie Naịjirịa bụ Femi Fani-Kayode akatọla emume Melaye na-eme n'elu igwe okwu soshal midia:

Akụkọ ga-amasị gị: