Akụkọkachasị n'ụtụtụ a: Kanye West sịrị na Donald Trump bụ nwanne ya
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:
Donald Trump ekelela Kanye West
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump atụpụrụla oti egwu bụ Kanye West ekele pụrụiche maka ịkwado ya.
Kanye West dị mbụ kwuo na ndị mmadụ agaghị egbochi ya ihụ Trump n'anya bụ onye ọkọwara dịka Nwanne ya nwoke.
Gọọmentị etiti ehiwela ngalaba na-ahụ maka iji mgbọrọọgwụ agwọ ọrịa ịba
Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-ere mgbọrọ ọgwụ na mkpa akwụkwọ onwereike ị nọ n'ofe ugbu a dịka Gọọmentị etiti etinyeala aka n'akwụkwọ ihiwe ngalaba na-ahụ maka iji ọgwụ ọdịnala agwọ ọrịa ịba.
Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Isaac Adewole kwupụtara nke a mgbe ndị isi ọchịchị nwechara mkparịta ụka ụnyaahụ.
MASSOB akatọọla ozi iti aka n'obi Buhari zigaara ndị Benue Steeti
Ebe foto si, Getty Images
Otu MASSOB akatọọla ozi iti aka n'obi onyeisiala Mohammadu Buhari zigara ndị Benue Steeti maka ogbugbu nke gụnyere ndị isi ha abụọ, kwuo na ọ bụ okwu ịkwa ndị ụka kraịst emu.
N'aka nke ọzọ Ohaneze ndị Igbo akatọọla ogbugbu ndị mmadụ ahụ ma kwuo na ọ bụ oke ihe arụ.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
Real Madrid amanyela otu ụkwụ n'ime agba nke ikpeazụ asọmpị Uefa Champịons dịka ha ji ọkpụ abụọ asatara otu merie ndị Bayern Munich
Onye oti ọkpọ bụ Deontey Wilder ewepụtala ego dị nde dọla iri ise(50mdolla) iji ma Anthony Joshua aka ọkpọ
Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Ọrịa kansa abụghị ikpe ọnwụ
Onye meriri ọrịa kansa